A TỤỌLA otu nwata nwoke gbara afọ iri na asatọ nga ọnwa atọ maka igoro ekwenti ‘Nokia’ nke e zuru n’ohi.
Ọ bụ n’ụlọikpe Karu Grade I Area Court, Abuja, ka a nọ kpee nwata nwoke a, nke aha ya bụ Abdulkudus Shuaibu ikpe ma tụọ ya nga.
Ya bụ nwata nwoke kwetera na ya mehiere ma rịọ ka e meere ya ebere.
Onye ọkaikpe bụ Sani Mohammed tụrụ ya nga ọnwa atọ ma nyekwa ya ohere iji ego wee gbara isi onwe ya. Ego ahụ bụ puku naira anọ.
Na mbụ onye ọkaikpe kwuru na Shuaibu gotara ya bụ ekwentị e zuru ezu puku naira abụọ na narị naịra ise.