AKA ndị uweojii akparala otu nwoke gbara afọ iri abụọ na anọ aha ya bụ Chinedu Innocent, maka itinye aka n’itọrọ nne enyi ya nwanyị.
Nke a mere n’okpuru ọchịchị Ukwa West na steeti Abia.
Innocent na mmadụ atọ ndị ọzọ bụ Ekendu Chidiebere, Tochukwu Samuel na Ikechukwu Nwankwo gbara izu ime ihe ọjọọ ahụ.
Anwụchịkọrọ ha n’Abuja abali olemole ha natachara puku narị naịra atọ (N300,000) site n’aka ikwu na ibe nwanyị ahụ.
Ozi e nwetara n’aka ndị uweojii kọwara na ndị ntọrị ahụ bụ ndị nọzi na ‘Force Headquarters’, Abuja, bụ ndị e jidere n’ihi nkpesa nke otu onye ikwu na ibe nwanyị ahụ bụ Agnes Semion kpesaara onye isi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris.
Otu onye kọkwara na Innocent bụ onye nke e buuru ya na nwanyị ahụ wee pụọ ụbochị a tọọrọ ya n’Aparazu Ogwu na steeti Abia maara ụzọ ya bụ mmiri siri baa n’opi ụgbogụrụ.
E kwuru na Innocent nọ na be nwanyị ahụ mgbe ndị ntori ahụ bịara; ha buuru ha abụọ pụọ.
Ka a hapụchara nwanyị ahụ ka ọ laa, Innocent gara n’ihu na-agwa ya ka o mee ka ezinaụlọ ya kwụọ ndị ntọrị ahụ ole ego ha kwuru, ọ bụzị nke a mere ka a kpọọ ya ka ọ zara ọnụ ya. Site n’ụzọ dị otu a, a chọpụtara na ọ bụ ya nyụrụ ihe ahụ na-esi.
Innocent kwuru na iwe ya bụ ka ọ napụta nwanyị ahụ ego, ya na ka o wee taa enyi ya nwanyị ahụhụ maka iso nwoke ọzọ,
Innocent kwupụtara na ọ bụ anyaọkụ tinyere ya n’agwa ọjọọ ahụ. Ọ kwakwara arịrị na ndị ha na ha kpara nkata aghụ enyebeghị ha ego nke ha tupu a nwụchịkọọ ha.