NDỊ ọchịchị ụmuakwụkwọ mahadum Nnamdi Azikiwe, (Students Union Government) dị n’Awka bịara n’ụlọ ọlụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light na Ka Ọ Dị Taa bụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) maka nkwanye ugwu nke ha nyere onye isi ụlọ ọlụ ahụ bụ Chuka Nnabuife. A nọrọ na ya gbaa onye isi ha bụ Igwebuike Ikenna ajụjụ ọnụ. Otu a ka o si ga:
Olee otu isi hụta ọlụ a si aga kemgbe ị malitere ọchịchị?
Ọ dịghị mfe mana site n’amara Chineke, a na m alụ ya site n’enyemaka ndị otu m na ndị ọlụ nke ụlọakwụkwọ anyị.
Olee mgbe I malitere ọlụ a?
Amalitere m ọlụ a ka ọnwa Jenuarị dị na mkpụrụbọchị iri na isii n’afọ a bụ 2018.
Olee mgbanwe ị weterela na ndị I ka na-akwadebe iwebata?
E nweziri ezi mmekọrịta n’etiti ndị ochịchị ụmụakwụkwọ (SUG) na ndị ọchịchị/ndị isi ụlọakwụkwọ. Anyị na-ahazi ihe mmemme dị iche iche dịka aka ọlụ, nkuzi semina, iso mpi, w.d.g. Onye turu ugo n’asumpi a, na-enye ya ego iji malite ihe ọ ga-eme. Anyị na kọmishọna na-ahụ maka gburugburu na-alụkọkwa.
Gwa anyị maka ihe mmemme nke kpatara onyinye nkwanye ugwu a?
Afọ a mere ya afọ iri abụọ na ise e ji hibe out a na mahadum anyị. Anyị enwechaghị nnukwu ohere izisa ozi nke ọma mana otu o sina dị, ndị chibugoro ụmụakwụkwọ n’oge gara aga bịara, tinyekwara onye isi mahadum anyị bụ Ọkammụta Joseph Ahaneku na ndị ọlụ ụlọakwụkwọ a. Dịka anyị maara, afọ a anyị gbara iri abụọ na ise agwụbeghị. Nke a mere na anyị kpebiri ịwụcha n’ụlọ ọlụ ANPC. Njem anyị a ewetala ezi mmekọrita n’etiti anyị na ụlọ ọlụ a.
Olee ihe dị iche iche e mere maka ya bụ ọgbụgba afọ iri abụọ na ise?
Mmemme ahụ bụ nke were otu izuụka. E mere ya n’izuụka ụmụakwụkwọ (student’s week). Nkuzi maka ncheta ogbugba afọ ‘Anniversary lecture’ bụ nke e mere na Tuzdee, ọnwa Junu dị n’ụbọchị nke iri na abụọ. Ụbọchị ahụ ka anyị kwanyere ọtụtụ ndị mmadụ ugwu.
Olee ndị ọzọ a kwanyeere ugwu ụbọchị ahụ?
A kwanyeere ọtụtụ ndị mmadụ ugwu ụbọchị ahụ nke a gaghị akpọpụtacha ha. Ha gụnyere onye na-ahụ maka ihe metuụtara ụmụakwụkwọ (Dean Students Affairs), ndị isi ngalaba dị iche iche, ndị isi chibugoro ụmụakwụkwọ tinyekwara ọtụtụ ndị ọzọ. A kwanyeere ha ugwu dịka ọlụ ha si dị. Ndị dị ka Emeka Nwolisa, Emeka Igwe w.d.g.
Olee ihe unu lebara anya wee họpụta ndị unu kwanyeere ugwu?
Anyị lebara anya na mbọ na ọlụ ndị mmadụ.