A DỤỌLA ndị na-akwọ ụgbọala na ndị na-azụ ahịa n’okporo ụzọ dị iche dị n’Ọnịtsha na okirikiri ebe ahụ ka ha kwụsị ịnọchisi ụzọ ebe ụgbọala na ndị mmadụ si aga, iji wee gbochie ihe nhịa ahụ ma ọ bụ ihe mberede okporo ụzọ.
Onyeisi ụlọ ọlụ Anambra Traffic Management Agency, bụ Maazị Chris Ụzọechina nyere ndụmọdụ a ma dọọ aka na ntị a oge ya na ndị òtù ọlụ ya gara ọlụ ịchụsịsị ndị na-adọchi ụzọ na ime ka ohere dị n’okporo ụzọ dị iche iche dị n’Onịtsha na gburugburu ya.
Ya bụ ọlụ bụ nke ha màlitèrè n’okporo ụzọ gara Owerri, buru ya gaa mpaghara Upper Iweka, wee pụta n’okporo ụzọ Oguta na mpaghara ebe ahụ e si abanye ime Ọchanja. Ọ sị na ebumnobi nke ahụ bụ iji wepụsịa ihe dị iche iche na-egbochi ụzọ, mee ka ụzọ na-aga siriri werere na steeti ahụ ma belatakwa ndapụta nke ihe mberede okporo ụzọ.
Ọ kpọkuzịrị ndị dị iche iche na-etinye aka n’idochi okporo ụzọ ka onye ọbụla sepu aka na ya maka ọdịmma nke onye ahụ n’ihi na ndị òtù ahụ agaghị emekwara onye ọbụla a hụrụ na nke ahụ ebere, ma ya fọdụzie ịhapụ ụgbọala ma ọ bụ ngwa ahịa ọ bụla ha jidere n’ihi nke a, ma mekwazie ka a mara na ụlọ ọlụ ahụ ga-emerịrị ihe ọbụla ọ ga-ewe iji hụ na ndị na-akwọ ụgbọala na ndị na-azụ ahịa rubèrè isi na ya bụ ndụmọdụ ma na-erubekwara iwu na-achị okporo ụzọ isi.
Ụfọdụ ndị na-akwọ ụgbọala n’Ọnịtsha, nke gụnyere Maazị Emeka Eze na Daniel Ike kọwara atụmatụ ahụ dịka nke magburu onwe ya, kọọ akụkọ banyere ihe nhịa ahụ ha na-agabiga n’ịkwọ ụgbọala na mpaghara ebe ahụ ma ndị mmadụ kpọbachaa ahịa ma ọ bụ dọchichaa ụgbọala n’okporo ụzọ.
Ha tokwazịrị ọchịchị steeti ahụ maka inwe mmetụta banyere ndụ na ọnọdụ ụmụ mmadụ n’obi, tòó ndị ụlọ ọlụ ahụ maka ọmarịcha ọlụ ahụ ha bịara na mpaghara ahụ, dịka ebe niile ahụ chafògòrò, ma kpọkukwazie ndị otu ha ndị na-anya ihe ọnyịnya nakwa ndị ọzọ ndị na-ere ahịa, ka ha were ndụmọdụ ahụ dị oke mkpa wee kpọrọ ihe.