ỌCHỊCHỊ steeti Anambra ekwuputanwòóla njikere ya ịkwàlite otútó, mmepe na ọdịmma nke ndị ntorobịa steeti ahụ site n’ịga n’ihu n’ịtụpụta atụmatụ mwulite dị iche iche metụtara ha.
Osote aka na-achị steeti ahụ, bụ Dọkịta Nkem Okeke mere ka a mara nke a n’Awka, oge ndị ndu nke otu Nigeria Youth Council of Nigeria, ngalaba mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ Nigeria bịara kpọtụrụ ya n’ụlọ ọlụ ya dị n’obi gọọmenti.
Dịka ọ na-anabata ndị otu ahụ n’aha aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ, Dọkịta Okeke mere ka a mara mkpà ọ dị, bụ ime ka ezi mmekọrịta na mkparịta ụka dị n’etiti gọọmenti na ndị ntorobịa, bụ ndị o kwuru na o kwesiri ka a na-akwàdo oge ọbụla, iji mee ka ha soro na ndị e ji okwu ha agba ìzù na ndị a na-elegara anya n’ogoogo mba ụwa.
O kwere nkwà nkwàdo nke ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ nye ndị ntorobịa, ma kpọkuo ha ka ha were ọmarịcha ọnatarachi dị iche iche Chineke jiri gọzie ha wee bàárá onwe ha na obodo ha úrù.
Na mbụ n’okwu ya, osote onyeisi oche ndị òtú ahụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, bụ Maazị Chibuike Echem, onye duru ndị ahụ wee bịa mkpọtụrụ ahụ mere ka ha mara na otu n’ime isi sekpụ ntị na ọbịbịa ahụ ha bịara bụ ka ha gosi gọọmenti steeti ahụ onwe ha dịka ndị ndú a họpụtara ọhụụ na nhọpụta ahụ ndị òtù ahụ chịkọbara nsó nsó a na steeti Gombè.
O kwuru na nhọpụta ahụ bụ nke ndị ntorobịa abụọ sitere steeti Anambra nwètara ọkwa abụọ n’isi ọchịchị nke otu ahụ n’ala anyị, nke bụ ọkwa ósòtè onyeisi oche òtù ahụ n’ala anyị na òsòtè onyeisi oche ndị òtù ahụ na mpaghara ndịda-ọwụwụa anyanwụ, bụ nke ọ kọwara dịka nke mbụ na mbụ kemgbe òtù ahụ màlitere.
Ọ kọwara òtù ahụ dịka òtù jikọtara ndị ntorobịa niile nọ n’ala anyị, ma kwaa arịrị na ọtụtụ ndị mmadụ ejighị ya bụ otu wee kpọrọ ihe ma ya fọdụzie ịkwanye ma ọ bụ sonye n’ihe ha na-eme.
O jikwazị ohere ahụ kpọọ òkù maka njikọ aka ọnụ nke gọọmenti na ndị òtù ahụ, ma rịọkwazie nkwàdo nke ọhaneze n’ihe dị iche iche ndị otu a na-eme, ọbụnadị dịka o tòrò ọchịchị steeti Anambra dịka ọchịchị jiri ndị ntorobịa wee kpọrọ ihe, nakwa ọchịchị e jiri ịkwàdò ndị ntorobịa wee mara n’ala anyị.