KỌMISHỌNA na-ahụ maka ahụ ike na steeti Anambra, Dọkịta Josephat Akabuike, emeela ka a mara na ihe ruru ụmụnwaanyị iri na asaa amụọla ụmụ n’ebe dị iche iche e wepụtara maka ndị ahụ iju mmiri chụpụrụ na be ha.
Kọmishọna Akabụike kwuru nke a oge ọ na-anabata ndị otu ‘Nigerian Medical Association’ (NMA), ngalaba nke steeti Anambra, bụ ndị bagidere n’ọlụ ahụike nso nso a n’ogige ebe ahụ e wepụtara maka ndị ahụ iju mmiri chụpụrụ na be ha na Agụleri dị n’okpuru ọchịchị Anambra East na Atanị dị n’okpuru ọchịchị Ọgbaru.
O kwuru na n’ime ụmụnwaanyị ndị nọ n’ogige ahụ nke dị n’Atanị, na abụọ n’ime ha amụọla ụmụ, n’ụlọ ahụike ‘Comprehensive Health Centre’ (CHC) dị n’obodo ahụ, ma kwuo na ọchịchị steeti ahụ etinyesiela atụmatụ dị iche iche ga-enye aka ịhụ na ụmụnwaanyị dị ime nọ n’ogige niile e nwere na steeti ahụ maka ndị iju mmiri chụpụrụ na be ha ga-enwe ezi nchekwaba ma nọrọkwa n’ezi ọnọdụ ahụike bụ ịgbà.
N’okwu nke ya, onye ji ọkwa ‘State Hospital Director’, na steeti ahụ bụ Dọkịta Richmond Achụgbu, kwuru na ụmụnwaanyị ọzọ dị iri na otu n’ọnụ ọgụgụ bụ ndị mụrụ nwa ọhụụ na ndị na – enye nwa ara ugbu a bụzị ndị e nyegoro ọnọdụ n’ogige ‘Central School Odekpe Holding Centre’,
bụ ebe ọ sịrị na ha na ụmụ ha nọkwa n’ezi ọnọdụ ma na-ekwekwa oyooyo ugbu a. Ọ sị na ụmụ nwaanyị ndị dị ime n’ogige dị iche iche, bụkwa ndị nwere obere nsogbu ahụ ike bụzị ndị a na-enye ọgwụ ugbu a n’ogige ‘Comprehensive Health Centre’, ebe e zipugokwara ndị ọlụ ahụ ike ụfọdụ ka ha gbaga ọsọ enyemaka n’ogige ebe ndị ọzọ dị iche iche.
Ụfọdụ n’ime ụmụnwaanyị ahụ mụrụ nwa n’ogige ‘Central School Odekpe Holding Centre’ gụnyere: Celestina Ifeanyị, Chisom Ọzah, Joy Christian, Esther Innocent, Ọlụchi Eden, Elizabeth Emeka, Ọlụchi Ogbede, Assịsị Iyabọ, tinyere Promise Daniel, Chizọba Obene, Angela Udọji, na Chiọma Sunday.