ỤMỤNWANYI bi n’ime obodo na mba ụwa nile ka echetara ha na ọlụ ha ụbọchị Monde bụ abali iri na ise nke ọnwa a. Na ncheta nke afọ a, isi okwu e ji mee mmemme a bụ ‘Sustainable Infrastructure, Service and Social Protection for Gender Equality and Empowerment of Rural Women and Girls’.
Isi okwu nke ewepụtara n’afọ a metụtara ịkwado ụmụnwanyị na ụmụagbọhọ. N’ezie, ụmụnwanyị nọ na ime-ime obodo na mba ụwa nile na-ata ahụhụ n’ihi na ọ bụ ha ka ọlụ nile na adakari n’isi. Ọ bụ ụmụnwanyị n’alụkari ọlụ ụgbọ ma ọ bụ ịzụ ahịa, ha na ụmụ ha ndị nwanyị, ebe ndị nke nwoke adịghị ekwe esokari nne ha eje ọlụ ma ọ bụ ahịa n’ime obodo.
Ị gaa n’ime obodo ụfọdụ, ọ bụ ụmụnwanyị ji aka ha akọ ọlụ ugbo ha, lụchasia ahịhịa dị n’ubi ahụ. Ihe ndị a nile ha na-akọ dịka ji, akpụ, ede, osikapa, nduku, unere, okro, akwụkwọ nri, egwusi na ine ndị ọzọ.Ọ bụkwa ha na-ewepụta ihe ha na-akọpụta ta ya ma oge iwepụta ya ruo. Ọ bụkwa ha na ụmụ ha ndị nwanyị ga-ebu ya gaa ahịa.
Ebe ụfọdụ ezigbo ụzọ adịghị, ọ bụ isi ka ha ga-eji buru ihe ahụ gaa ebe dị anya ka ha wee ree ya ma nweta ego. Oge ụfọdụ n’ihi enweghị ezigbo ụzọ, ha agaghị enwe ike iburu ihe ha kọpụtara baa ahịa dịka okwesiri. Ihe ha kọrọ anọrọ na ubi n’ihi na ebe ọ dị dị anya na-emebi.
Ọ bụ aka ha ka ji alụ ihe ndị a nile. Ọ bụ nke a mere na ịhụ ụmụnwanyị nọ n’ime obodo a naghị edo ahụ dịka ndị nke nọ n’obodo mepere emepe. Ọ bụghị na ha adịghị eri nri, kama ọ bụ n’ihi na ha adịghị ezu ike malite n’ịzu ruo n’izu.
Ihe ọzọ na echere ụmụnwanyị nọ n’ime obodo aka mgba bụ na ha adịghị enweta ego dịka ha si alụ ọlụ. N’ezie, ụmụnwanyị na mba ụwa nile, ọkachasi ndị nọ n’ime obodo ha na-agba mbọ nke ukwu. Okwesiri na ndị na-achị na mba ụwa ga na-elebara ụmụnwanyị ndị a anya n’ụzọ pụrụ iche, inye ha ọkachasi ihe ndị ahụ ha agaghị emenwuru onwe ha dịka ezi okporo ụzọ, ezigbo mmiri, ezigbo ụlọ ọgwụ, ezigbo ndị ọlụ ahụ ike, ụlọ ahịa, ọkụ latrik. Ihe ndị a ga-eme ka ndụ na atọ ha ụtọ dịka ndị ibe ha nọ n’obodo mepere emepe.
Ụfọdụ ezinaụlọ na mba Africa, ọ bụ nwanyị n’ebu ọtụtụ ibu dị na ya na agbanyeghị ihe nile ha n’alụ n’ezinaụlọ na obodo. Ụmụnwoke ka na-eleda ụmụnwanyị anya na egosi ha na ha esoghi n’ihe a na-eme. Nke ọzọ bụ na mba Africa ọdị ọtụtụ omenala kana emegide ụmụnwanyị.
Oge ụfọdụ, di nwanyị nwụọ, amalite ịta nwanyị ahụhụ, sị na ọ bụ ya gburu di ya.