NDỊ Orofịa Abagana, n’okpuru ọchịchị Njikọka nke steeti Anambra akpọkuola gọọmenti steeti ahụ ka o mee ngwa ngwa gbatara ha ọsọ enyemaka n’ebe ahụ mbize na-akwado ịchụpụ ha na mpaghara ahụ.
Ya bụ mbize, bụ nke dị n’okporo ụzọ Anyansị ka e kwuru na ọ dị Kilomita anọ n’ogologo, dị fiiti isii n’ímì, ma bụrụkwa nke gbasawanyere n’afọ a n’ihi oke mmiri ozuzo ahụ weere ọnọdụ.
N’okwu ya dịka ha na-akpọgharị ndị nta akụkọ na mpaghara ebe ahụ, otu onye n’ime ndị mbize ahụ na-enye ụlọ ya nsogbu, bụ Maazị Matthew Okeke mere ka a mara na ya bụ mbize bụzị ihe iche aka mgba nyegara ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ na osisi ụfọdụ bara oke uru dị na mpaghara ahụ.
O kwuru na ndị obodo ahụ agbaala mbọ dị iche iche iji gbochie mbize ahụ ịgbasawanye, site n’igwu olulu nghọ mmiri na mpaghara ebe ahụ, bụ nke ọ sịrị na ọ mịtaghị mkpụrụ ọma dịka a tụrụ anya.
Na ntụnye nke ya, onyeisi oche nke ‘Ọrọfịa Village Association’, bụ Maazị Sebastian Anyansi, kwuru na ebe ahụ mbize ahụ na-enye nsogbu bụ okporo ụzọ jikọrọ ndị ógbè ahụ na ahịa obodo ahụ bụ Oye-Agụ Abagana, n’oge mbụ, ma kpọkuo gọọmenti ka o mee ngwa gbatara ha ọsọ enyemaka aka ọkụ aka ọkụ, tupu ya bụ ihe agafee ihe e chere na ọ bụ ma ọ bụ mebisikwuo ọtụtụ ihe karịa ka a tụrụ anya.
N’otu aka ahụ, onyeisi ọchịchị obodo Abagana, bụ Maazị Ikem Ọnwụadị, kwuputara ihe obodo ahụ megoro n’onwe ha iji kpàá mbize ahụ eze,
ma tòó ọchịchị steeti ahụ nakwa ọchịchị ala anyị n’ihi ọsọ ha gbatagoro na mbize abụọ ọzọ na-enye nsogbu n’obodo ahụ, bụ mbize úgbö Ọzara na mbize Uruọkpara-Ụmụdunu. Ọ kpọkuzịrị ha ka ha mara ihe ha ga-eme mbize nke ahụ a kpụ n’ọnụ ugbu a, iji wee zọpụta ndị bi ebe ahụ ma gbochie ihe mberede ma ọ bụ akụkọ ọjọọ ịdakwasị ndị ógbè ahụ.