E KWUOLA na ọnụọgụ ndị nwụrụ na ya bụ ọkụ ọgbụgba dapụtara na steetị Abia n’izuụka gara aga eruola otu narị mmadụ na iri ise.
Ọ bụ Eze Ikechukwu Chiavoghilefu, onye isi oche ndị eze ọdinala n’okpuru ọchịchị Osisioma, ebe ya bụ ọkụ ọgbụgba ‘pipeline explosion’ dapụtara kwuru nke a.
Dịka Eze Chiavoghilefi siri kwu, imirikiti ndị mmadụ, ndị meruru ahụ n’ihi ọkụ ọgbụgba ahụ na-anwụ n’ike n’ike. Ọ rụtụrụ aka na n’ime otu ụlọ ahụ ike e bugara mmadụ ruru iri asaa, mana n’ime awa iri abụọ na anọ (otu ụbọchị) mmadụ karịrị iri atọ n’ime ha nwụrụ.
Onye eze a kwuru nke a oge onye na-anọchite ha n’ụlọ nzukọ sineti bụ Theodore Orji wụchara n’ebe ahụ iji kasie ndị nke a metụtara obi.
Eze ahụ kwuru si, “ihe dịka mmadụ iri asaa bụ ndị ọkụ gbara ka e bụgara n’ụlọ ahụike dị n’akụkụ ụlọ m n’ụbọchị mbụ ya bụ ihe mere mana ugbua, ha nile a bụrụla ndị nwụrụ anwụ. Ihe ruru otu narị mmadụ na iri ise anwụọla ka ọ dị ugbua.”
Ọ gara n’ihu kwuo na ha nọ n’ọgba aghara n’ihi ọnwụ ahụ nke ka na-agarịrị n’ihu n’ihi oke mmeru ahụ ndị mmadụ nwetere site na ya bụ ọkụ ọgbụgba.
N’aka nke ya, Eze Godswill Mgbarime nke Umueze, bụ ndị obodo nke a metutakwara na-akọwa na ọtụtụ ndị nke ya anwụọla n’ihi mmeru ahụ ha nwetara.
Eze Mgbarime tara ndị ọlụ nchekwa ụta n’ihi na dịka o siri kwu, na ha nọ na-anara ndị mmadụ ego ma hapụ ha ka ha na-eku mmanụ site n’ebe okporo paipụ si gbawa kama ha ga-egbochi ha ịbata n’ebe ahụ.
Dịka Eze Mgbarime siri kwu; “mgbe yabụ ihe jiri hipụtaba, ụfọdụ ndị ọlụ nchekwa bịara ebe ahụ mana kama ịlụ ọlụ ha, ha bidoro naraba ndị mmadụ otu puku naira ma hapụ ha ka ha kurube mmanụ. Anyị nụrụ na ndị ọlụ nchekwa mmadụ atọ ahụ soro nwụ mgbe ọkụ bidoro gbawa.”
N’okwu ya na njem ahụ, Senator Orji kpọkuru gọọmentị etiti ka ha mee ngwa ngwa zite ndị ọ dị n’aka ‘National Emergency Management Agency (NEMA)’ ka ha zite ihe enyemaka na ọgwụ n’ebe obodo ndị o metụtara nọ.
O tiri mkpu maka ya bụ mkpamkpa kparanụ. O kwuru si, “Abịara m ma hụkwa ọtụtụ ihe mebirinu. E tufuru ọtụtụ ndụ, ụlọ na ala ubị.”