N’IHI na a sị na okpu na-aka mma n’isi onye o kwesiri, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ abụrụla onye a nọrọ na nso nso a wee nye nkwanye ugwu pụrụ ichè dịka ‘ọka ibe nke ọchịchị onye kwùó úchè ya’ (Champion of Democracy) n’ala Nigeria.
Ya bụ nnukwu nkwanye ùgwù bụ nke e nyere ya na mbà Boston n’isi ngwụcha izuụka gara aga, site n’aka òtù a kpọrọ ‘Nigerian American Multi-Service Association (NAMSA)’, bụ òtù jikọtara ụmụafọ ala Nigeria bi nà Massachusetts nke mbà US, ma bụrụkwa òtù na-agbasi mbọ ike ịkwàlìtè omenala na ọnatarachi nke ala Nigeria na mbà Africa. Mmemme inye nkwanye ùgwù ahụ dọtara ọtụtụ ụmụafọ ala Nigeria bi na mbà ahụ, ma bụrụkwa otu n’ime ihe ndị mere ka njèm nlegharị anya nke Gọvanọ Obianọ gara na mbà Boston kpòghara ọkụ ma magbukwa onwe ya.
N’okwu ya dịka ọ na-enye ya nkwanye ùgwù ahụ, onyeisi ndị òtù ahụ, bụ Maazị Godwin Nnanna, tòrò ya bụ gọvanọ n’ihi ihe dị iche iche o mepụtagoro nà mbọ pụtara ìhè ọ gbagoro iji gosi na ezi ọchịchị bụ ihe kwere omume n’ala Nigeria.
O rụtụrụ aka na mmeri ahụ ụmụakụkwọ nwaanyị ise ahụ sitere steeti Anambra nwètara nso nso a na asompi mba ụwa ahụ weere ọnọdụ na San Francisco, bụ nke a kpọrọ ‘World Technovation Challenge’ ma kwuo hoohaa na nke ahụ esighị n’elu wee dà, kama na ọ bụ site n’ezi atụmatụ ọchịchị nke gọvanọ Obianọ.
Maazị Nnanna gara n’ihu kọwaa na ọ bụ ọtụtụ ịgba dị iche iche Obianọ na-eti na steeti ahụ mere mere ya bụ steeti jiri nọrọ n’ezi ọnọdụ mmepe dị elu ugbu a ma bụrụkwa ebe a na-anụ akụkọ ọma banyere ezi ọchịchị kwa ụbọchị n’ime ya. Ọ kpọkukwàzịrị ya ka o jide ka o ji, ma kwekwa ya nkwà nkwàdo nke ndị otu ahụ n’iji kwàgide ezi ọchịchị ya.
Na nzaghachi, Gọvanọ Willie Obianọ, onye ọñụ jupụtara obi, kelere ndị otu ahụ maka ịhụta ya dịka onye tozùrù òkè maka nkwanye úgwú ahụ. Ọ kọwara ya dịka nnukwu ihe àgbàm ume, ma kwuo na nkè ahụ gà-enye aka ime ka ya gaa n’ihu n’ezi ọlụ ahụ o ji n’aka na steeti ahụ.