ỌNWỤ nwa dị afọ iri na otu ọkụ latrik gbagbulu , nke ụlọakwụkwọ Government Secondary na Calabar, Cross River Steeti, etinyela ezinaụlọ ya n’ ihe mgbu.
Nwata ahụ, a maara dịka Isaac Sunday Okon, bụ onye ọkụ dọgburu ka ihe eriri na -ebu ọkụ latrik aga jidechara ya mgbe o ji nkeji iri atọ gafee elekere nke mbụ n’ ehihie ụbọchi Fraịdee, ka ụlọakwụkwọ nọzi na nchịkọta.
E kwuru na nwa a nwụrụ anwụ bụ naani otu nwa nwoke nne ya bụ Oriakụ Happiness Sunday Okon bụ onye na-azụ ahia ji.
E kwuru na ihe mberede a mere mgbe ndị nkuzi gwara ya ka ọ tụtụọ ahihia dị n’okirikiri ụlọakwụkwọ tupu ọ laa. N’amaghi ama, o wee zọnye ụkwụ n’ eriri na -ebu ọkụ latrik aga, o wee dogbuo ya.
E tinyere ozu ya n’ebe a na-echekwa ozu nke dị na ‘University of Calabar Teaching Hospital (UCTH).