Ọ BỤ nnọọ oge ntụgharịkọta uche na oge ichegharị echiche, dịka òtù a kpọrọ ‘Association of Professional Bodies of Nigeria’, bụ òtù jikọtara ndị ọkachamara n’ala Nigeria, ngalaba ya nke steeti Anambra nwere nnukwu ọgbakọ omenahọ ha nke afọ 2018.
Ya bụ nnukwu ọgbakọ wééré ọnọdụ n’Awka bụ nke dọtara ọtụtụ ndị ọkachamara na ngalaba ọmụmụ na ngalaba ọlụ dị iche iche, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee tụlee ma tụgharịa uche n’ọnọdụ ndị Igbo n’ala Nigeria, dịka o siri metụta mnwere onwe ala anyị.
N’okwu ya dịka ọ na-enye nkuzi n’ọgbakọ ahụ nke isi okwu ya bụ “Nigeria Kemgbe Mnwere Onwe: Nke A Gàgòrò Aga, Kedu Ka O Siiri Gbata Kwụrụ, Maka Ndị Igbo?”, eze ọdịnala Ifitedunu, bụ Igwe Alex Emeka Iloụnọ (Ezedunu n’Ifitedunu) kọwara ndi Igbo dịka ndị na-agbasi mbọ ike, ndị nwere ntachi obi na ndị nwere ọgụgụ isi bụ ịgbà, ọ bụnadị dịka ọ rụtụrụ aka n’ọtụtụ ọmụma atụ dị iche iche ebe ndị Igbo gosiputagoro ọmarịcha ọnatarachi ndị a n’ụzọ dị iche iche. Ọ kọwara akparamagwa na ọnatarachi ndị ahụ dịka ndị na-enyere ndị Igbo aka ịga n’ihu n’ihe dị iche iche ha na-eme na-agbanyeghị ọnọdụ mkpàgide dị iche iche ha na-agabiga n’ala Nigeria, bụ ala nke ha gbara nnukwu mbụ pụtara ihè iji napụta ọchịchị ya n’aka ndị ọcha.
Dịka ọ na-akatọ otu e si ákpàgide ndị Igbo n’ala Nigeria, Igwe Iloụnọ gara n’ihu kpọnwèé òkù ahụ a kpọbara ndị Igbo kemgbe, bụ ‘Akụ Ruo Ụlọ’, nke e sitere na ya wee na-akpọku ndị Igbo ka ha wèlata akụ ha ụlọ, bịa dozie ma wunye akụnụba ha n’ala Igbo, iji wee bèlata ihe ha na-agabiga, mepee mpaghara ha, ma belatakwa ndàbere ahụ ha dàbèèrè na gọọmenti etiti, bụ onye rara ntị mmanụ kemgbe bànyere ọnọdụ ha na ihe ha na-agabiga.
Na ntụnye nke ya dịka ọ na-atọsà ya bụ isi okwu n’ụdị mkparịta ụka, otu onye n’ime ndị mkparịta ụka n’ọgbakọ ahụ ma bụrụkwa onyeisi isi ngalaba ọmụmụ ihe ‘Social Sciences’ na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka, bụ Ọkammụta Stella Ọkụnna, kwàrà arịrị na a dịghịzị agbaso usoro itozu òkè were eme ihe dị iche iche n’ala Nigeria oge ugbu a, ma katọkwa ótú ndị Igbo si eme onwe ha ‘onye kwụrụ ọtọ, e gbutuo ya’, bụ ndị o kwuru na ha kwesịrị ijikọ aka ọnụ n’ụdị inyerịta onwe ha nkwàdo, iji wee zọta ọnọdụ ha n’ala Nigeria taa.
Onye ọzọ bụkwa onye mkparịta ụka na ya bụ ọgbakọ, bụ Maazi Ibiụlọ Bruno, mere ka a mara na obodo ọbụla na mba ụwa na-adàbekọrịta n’onwe ha n’ihi ótù ihe ma ọ bụ nke ọzọ, kọwaa ndị ọkachamara dịka ndị nwere ọtụtụ ọrụ chere ha n’ihu n’ime ka ọnọdụ ala anyị kawanye mma, ma kpọkukwazie ha bụ ndị ọkachamara na ndị Igbo n’izùgbe ka ha na-ewunye akụnụba ha na ngalaba ihe ndị ahụ dị oke mkpà n’obodo, bụ nke ọtụtụ mmadụ etinyebeghị aka na ya.
Na mbụ n’okwu mmalite ya, onyeisi oche na mmemme ahụ ma bụrụkwa eze ọdịnala Ụmụerì, bụ Igwe Ben Emeka (Oke-ebo nke abụọ n’Ụmụeri), kọwara ọgbakọ ahụ na isiokwu nke afọ a dịka nke magburu ónwe ya, ọ kachasị n’ilegara anya n’ọnọdụ ala Nigeria nọ na ya ugbu a, na òtù ọnọdụ ndị Igbo siri kwụrụ taa na Nigeria.
N’ozi nnọọ ya, onyeisi oche ndị òtù ahụ na steeti Anambra, bụ Dọkịta S.A. Ezeagụ, kọwara ya bụ òtù dịka mbịakọtá ọnụ nke òtù na ndị ọkachamara niile nọ n’ala anyị, iji wee kpaa ihe metụtara ha dịka òtù, tụlee ma wètakwa mgbochi nyegara nsogbu dị iche iche na-echere ala anyị aka mgba. O kwuru na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji wee dọta ntụnye na ọnụ mmiri okwu ndị ọkachamara n’ihe gbasaara mkpu ahụ a na-eti kemgbe bànyere ọnọdụ ndị Igbo n’ala anyị na òkù ahụ a na-akpọ ka a hazigharịa ụdịdị na usoro ọchịchị nke àlà anyị.
Ụfọdụ n’ime ndị ọzọ sonyere n’ọgbakọ ahụ gụnyere: onyeisi oche otu APBN n’ala Nigera, bụ Olumuyiwa Alade Ajibola (Agbakin n’Ile Ife); onyeisi kọmitii haziri ọgbakọ a, bụ Lady Chinwe Nnedum; eze ọdịnala Awka, bụ Igwe Gibson Nwosu (Eze-Ụzụ); eze ọdịnala Ogidi, bụ Igwe Alex Onyido, onyeisi ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light, bụ Sà Chuka Nnabụife; onye ọgbàkọ ego izugbe na steeti Anambra n’oge gara aga, bụ Dọkịta Ngọzị Monica Okonkwọ, na ọtụtụ ndị ọzọ.
A nọkwara na mmemme ahụ wee nye ụfọdụ ụlọ ọlụ, òtù ọkachamara na mmadụ ndị megoro nke ọma na ngalaba ha ònyìnyé nkwanye ùgwù, ma gùzóbékwa òtù nlekọta bụ Board of Trustees nke òkù APBN na steeti ahụ, bụ nke Igwe Alex Onyido nọ n’isi ya.