ONYE jibu ọkwa dịka onye isi oche ndị bịshọọpụ ụka Katolik na Nigeria ‘Catholic Bishop’s Conference of Nigeria (CBCN)’, bụ Achịbishọọpụ Ignatius Kaigama, arịọla ndị Boko Haram ka ha tọhapụ ndị nile ha ji nke gụnyere Leah Sharibu.
Gbasara ogbugbu e gburu onye ọlụ enyemaka ọzọ nke ICRC site n’aka otu ọjọọ ahụ bụ Boko Haram, ya bụ Achịbịshọọpụ nke dayọsis Jos kwuru na ọ gbagwojuru anya ihe otu ahụ ji aga n’ihu ịla ndị mmadụ n’iyi.
Ọ gara n’ihu kwuo na ọbụghị uche Chineke mmadụ imegide ibe ya. O kwuru si na nke ahụ abụghị mmadụ ika ụka. O kwuru na ọ na-ewute na a naghị asọpụrụ ndụ mmadụ. Dịka o siri kwuo; “Anyị nwere olile anya ma na-ekpekwa ekpere na ọ ga-akwụsị. N’aha ndụ mmadụ (humanity) na n’aha Chineke, onye ji ike nile, onye okike, ana m ekpe ekpere na ha ga-atọhapụ ndị nile ha ji.”
Achịbishọọpụ a gara n’ihu ịkwa arịrị maka ya bụ njide e ji Leah Sharibu na ndị ọzọ.
O kwuru na ọ bụ nnukwu mmegide n’ebe mmadụ nọ. O kwukwara na mmeri ga-adị n’ihi na ndị nile e ji ga-alakwuru ezinaụlọ ha otu ụbọchị.
N’aka nke ozọ; ndị otu a kpọrọ ‘Hausa Christians Foundation (HACFO)’ e deerela Leah Sharibu edemede leta.
Otu a akatọọla ya bụ ojiji nke otu Boko Haram ka jiriri ya bụ nwata nwagbogho dị afọ iri na ise,onye nke a tọọrọ ka ọnwa Febuari dị na mkpụrụụbọchị iri na iteghete n’afọ a.
Dịka ha na-akpọku ụmụ Nigeria nile maka ekpere n’isi Leah, ụfọdụ ihe ha deere ya na leta bụ; “Ezigbo Leah Sharibu, ada ‘Zion’, anyi jụrụ ịgbachi nkịtị gbasara gi ma ruo ugbu a. Anyị na-ekpere gi ekpere kwa ụbọchị. Okwukwe anyị na-esiwanye ike kwa ụbochị. O kwere anyị ghọta na Chineke onye debere gị ndụ ruo taa ruru ogo nkeọma ịgbapụta gị n’aka ndị ọjọọ ahụ.
“Anyị hụrụ gị n’anya ma na-ekpekwara gị ekpere, Leah. Mnwere onwe gị bụ ugbua n’aha Jesus.”