DỊKA otu ụzọ n’iburu oziọma gamie n’ebe dị iche iche, bishọọpụ ụka Anglịkan na dayọsiisi Awka, bụ ‘Rt. Rev.’ Alexander Chibuzọ Ibezim emeela njèm ọzụzụ atụrụ n’ụlọ mkpọrọ ala anyị dị n’Awka.
Ya bụ njèm oziọma bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ekpere ‘Chapel of Compassionate’ dị n’ụlọ mkpọrọ ahụ ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nwee òfùfè nrò pụrụ iche, nke e sitere na ya wee kwọọ mmadụ iri atọ na ise aka n’isi, bụ ndị a tụrụ nga n’ụlọ mkpọrọ ahụ.
N’okwuchukwu ya n’ofùfè nrò ahụ, Bishọọpụ Ibezim kọwara mmadụ ịbịakutè Chineke dị ka ụzọ pụtakarịchara ìhè e si enweta mnwere onwe na nzọpụta. O chetaara ha na ike dị n’ekpere, bụ nke Paul n’ime akwụkwọ nsọ na onye òtù ya bụ Banabas siri na ya wee nweta mmeri n’ime ụlọ mkpọrọ, dịka ọ dị n’akwụkwọ nsọ.
Bishọọpụ Ibezim gara n’ihu kpọkuo ha ka ha makụọ Chineke, ọ bụnadị dịka ọdụrụ ha ka ha ghara ịhụta ọnụnọ ha n’ụlọ mkpọrọ ahụ dịka ihe igbú mmụọ, kama ka ha hụta ya dịka oge iji nwògharịa ha ma kụnyekwa echiche ọhụụ n’ime ndụ ha. Ọ dụzịrị ha ka ha bịaruo Christ nso ma chègharịa na mmehie ha iji wee nweta mmezu nke ebube Chineke n’ime ndụ ha, dịka ọ rụtụụrụ ha aka na ndụ Nelson Mandela na ndị ọzọ a na-anụ aha ha anụ na mba ụwa ugbu a, bụ ndị o kwuru na ha bụ ndị nga n’oge gara aga.