MAHADUM Nnamdi Azikiwe dị n’Awka (UNIZIK), ngalaba na-ahụ maka ịlụpụta ọgwụ ‘Faculty of Pharmaceutical Sciences’ emeela emume nturu ugo na ịñụ iyi nke afọ.
Nke a bụ nnukwu mmemme nke a nọ n’ụlọ ezumezu ha ‘JUHEL Auditorium’ n’Agulu ebe ngalaba ahụ dị wee mee.
Onye isi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Ọkammụta Joseph Ahaneku kelere ụmụakwụkwọ ahụ maka nturu ugo ha. O kwuru sị; “obi bụ m sọ añụrị ịhụ ụmụakwụkwọ a ituru ugo mmeri. N’aha UNIZIK, ana m ekele ndị ọlụ nke ngalaba a, ‘Pharmaceutical School’, maka ịzụpụta nnukwu ụmụnwoke na ụmụnwanyị ndị a. Chetwakwanụ ụlọakwụkwọ unu; tinyere nne na nna na ngalaba unu gụrụ akwụkwọ. Kpacharanụ anya soo nzọ ụkwụ Nnamdi Azikiwem, onye bụ onye mbụ n’ala Nigeria, ma bụrụkwa onye mbụ n’amamihe. Ka mmụọ nke Zik na-ekwu okwu n’ime unu. Unu emebikwana ọlụ unu; unu nwere ọlu dịịrị unu nke bụ ime mma mgbe nile.”
Ọkammụta Ahaneku gara n’ihu ikele ndị Agulu maka iwepụta obosara ala ahụ, ọkachasi Dọkịnta Eric Okoye (JUHEL); ndị zụpụtara ụmụakwụkwọ ahụ na ndị nile nyere aka maka ọdị mma ụlọakwụkwọ.
Onye isi ngalaba ahụ (Dean) bụ Ọkammụta Ikemuefuna Uzochukwu, kelere mmadụ nile. O kwuru sị; “Anyị nabatara ọbịbịa unu. Taa ka a mụtara ndị ọhụrụ bụ ndị ga na-alụpụta ọgwụ. A malitere ngalaba a n’afọ 2016.” Ọkammụta Uzochukwu gara n’ihu kọwapụta mkpa nke ụlọakwụkwọ ahụ dịka ụgbọala, akụrụngwa laabụ, ebe obibi ụmụakwụkwọ, w.d.g.
O ji ohere ahụ kelee ndị mmadụ maka nkwado ha; kelekwaa onye isi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Ọkammụta Ahaneku.
Otu n’ime ndị zụpụtara ụmụakwụkwọ ahụ bụ Nze Godwin Ezeuko kelere Chineke maka ụbọchị ahụ.
N’okwu nke ya, otu nwata akwụkwọ so wee turu ugo bụ Valentine Chimezie Okoye, gosịrị ọñụ ya maka iso na ndị tuuru ugo. Nwa akwụkwọ a so na ndị nwetara nzere ‘first class’.
Ihe pụtakarịchara ihe e mere na mmemme ahụ gụnyere idu n’iyi, nke e meere ha mmadụ iri asaa na ise, ebe mmadụ asaa n’ime ha jiri nzere ‘first class’ wee pụta.
Ndị bịara mmemme ahụ gụnyere Dọkịnta Eric Ifeanyi Okoye (JUHEL); onye Registra otu ‘Pharmaceutical Council of Nigeria’; Elijah Muhammed, Ndị nnukwu ọlụ UNIZIK; Rt Rev E.O Ikeako onye so zụpụta nwa akwụkwọ; HRH Igwe F Ebelendu (Igwe Nnayelugo Aguluezechukwu) w.d.g.