AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ enyela igwe abụọ a họpụtara ọhụụ asambodo na steeti ahụ iji wee malite ọlụ ozigbo dịka eze ọdịnala obodo ha dị iche iche.
Mmemme inye asambodo ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa ma bụrụkwa nke dọtara ụfọdụ ndị e ji okwu ha àgbá ìzù na steeti, ndị obodo eze ọdịnala abụọ ahụ, nke dịgbàdò n’okpuru ọchịchị Ọgbaru, tinyere ndị enyi na ndị na-echere ha ezi echiche.
N’okwu ya dịka ọ na-enye ha àsàmbódò ahụ, Gọvanọ Obianọ tụụrụ ndị eze ọdịnala abụọ ahụ mmamma, bụ Igwe Fidelis Nsọfọr nke obodo Ụmụnankwọ na Igwe Lawrence Ọgụgụọ nke obodo Akịlị ọzịzọ, maka ịbụ ndị a hụtara dịka ndị tozùrú òkè idu obodo abụọ ahụ, ma kọwaa nhọpụta ahụ dịka nke a tụrụ anya na ọ ga-ewèta udo tọrọ àtọ n’ime obodo ha.
Ọ kọwaara ha bụ ndị eze ọdịnala mkpa ọ dị ịdị na-atụpụta atụmatụ dị iche iche maka ịkwàdò na ịkwàlìtè ndị ntorobịa n’obodo ha iji wee nyere ọchịchị steeti ahụ aka n’ezi mbọ ahụ ọ na-agba ugbu a iji hụ na onye ntorobịa ọbụla na steeti nwere ihe ọ na-arụ, iji wee bèlata arụrụ ala na omekomè. O mere ka a mara na agba nke atọ nke inye obodo ọbụla ego ka ha wèé họrọ ma rụọ ihe na-akpa ha ga-amalite na steeti ahụ mgbe adịghị anya.
Ya bụ aka na-achị achị gara n’ihu mee ka a mara na ọchịchị ya ga-amàlite ikesà ihe enyemaka nyegara ndị ahụ ìjú mmiri mebisiri ihe ha na nso nso a ngwa ngwa ìjú mmiri ahụ talatara, ebe a ga-enyekwara ndị ọrụ ugbo na ndị na-akụ azụ aka, bụ ndị ìjú mmiri ahụ bibigoro ihe ha jiri biri, iji wee màlite ọzọ. O jizịkwara ohere ahụ wee kpọkuo obodo dị iche iche ka ha na-enye ọchịchị ya nkwàdo zuru òkò iji wee gaa n’ihu n’imezupụta ọtụtụ atụmatụ ọrụ ọma na ọrụ mmepe dị iche iche o ji n’aka na ngalaba niile nke steeti ahụ.