ỤZỤ tụrụ nnọọ n’obodo Uruk Usung dị n’okpuru ọchịchị Obot Akara nke steeti Akwa Ibom, dịka ndị ntorobịa iwe juru obi jidere mmadụ atọ bụ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ohi, tie ha gwoo gwoo ma sunye ha ọkụ na ndụ, ha wee ree pịata ka akwụkwọ ụkpaka.
Mmadụ atọ ahụ e suru ọkụ na ndụ ka e kwuru na o tèéla ha jiri yibe ndị bi na mpaghara ahụ egwù, ma na-ezu ha kpataa, wee ruo ụbọchị ahụ mụọ kere ha bụrụ ha ọnụ, ndị ntorobịa ahụ wee nwụchikọọ ha na ndụ, oge ha gachara obere ‘ọlụ’ na mpaghara ahụ.
Nke a na-eme dịka ọ gachara mkpụrụ ụbọchị ole na ole e jiri suo otu onye ohi ọzọ gbara afọ iri atọ ọkụ n’Urua Ekpa dị n’Uyo n’otu steeti ahụ, bụ onye e kwuru na o zuru ọgbatumtum mmadụ ma chọọ ka ọ larie. Mmadụ atọ a kpọchara ka ewu bụ ndị e kwuru na ha ga-anọ n’agbata afọ iri abụọ na abụọ wee ruo n’afọ iri atọ.
Oge a kpọtụụrụ ya, onye okwuputa okwu ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ DSP MacDon Odiko, kwuru na ya ka na-aña ntị ka ya nata ozi site n’aka onye ‘Divisional Police Officer’ nke mpaghara ebe ahụ ihe ahụ nọrọ mee.