GỌỌMENTỊ Anambra adọlaa aka na ntị wee gwa steetị ndị ọzọ gbara ya gburu gburu ka ha ghara ịdị na-eduru ndị ara na ndị uche ezuchaghi oke na-ekposa ha n’ Anambra.
Ọ bụ komishọna na-ahụ maka ụmụaka na ụmụnwaanyi n’Anambra steeti bụ Oriaku Ndidi Mezue bụ onye mere ka a mata nke a mgbe o kwuru na gọọmentị Anambra elekọtala ma zụọ ịhe karịrị otu narị mmadụ bụ ndị nwere isi mgbaka na ndị uche n’ezughị oke. Ọ gara n’ihu kwue n’obodo ndị gbara Anambra gburu gburu ahụla na Anambra steetị nwere ogige na-ahụ maka nlekota ndị ara na ndị enweghị ebe obibi, tinyere ndị uche ezuchaghi oke, ha were maka ya were na-ekpote ha ka igurube na steetị ahụ.
Oriaku Mezue gara n’ihu kọwaa na ndị ara ahụ tinyere ndị arịrịọ bụ ndị mmadụ na-esi ebe dị iche iche were kpọbata n’Anambra na nzuzo. O kwuru na ‘Ministry’ ya akpọpụla ndị ara na ndị arịrịọ, tinyere ndị niile isi n’ezughị oke n’uzo niile dị n’Anambra.
Ọ kwuru na ha na-ewetere Anambra aha ọjọọ n’ihi na ha na- agagharị ka atụrụ enweghị ndị nche ma na- arịọ arịrịọ ego.
Ọ gakwara n’ihu were kwuo na ọ dịghị mfe ịzụ ndị ara na ndị uche ezuchaghi oke. Ọ sịrị na ọ nwere otu onye ara e si na UNIZIK ‘Junction’, Awka wee sogide rue n’Amawbia tupu ejide ya.”Ya bụ onye ara bụ nwata nwa okorobia gbara ihe dịka afọ iri abụọ kwuru na ya sị Edo steetị wee bata Anambra. O nwekwara oge n’adịghị anya e mere ngagharị wee jide ndị ara na ndị arịrịọ niile nọ n’Aroma. Otu nwaanyị ejidere oge ahụ kwuru na ya bụ onye Lagos steetị ma na ọ bụ ndị ikwu na ibe ya dutere ya ma hapụ ya n’Anambra”.