DỊKA a sị na ọ na-abụ àsịrị fo chi, o yie ezi okwu, gọọmenti steeti Ogun akagbuola kpamkpam, asịrị ahụ na-efegharị ugbu a na nwa amadi ahụ chịbụrụ ala Nigeria n’oge gara aga, bụ Ernest Shonekan anwụọla, ma kọwaa nke ahụ dịka asị ọcha na akụkọ ndị ọnọ n’ụlọ mara ihe zụrụ n’ahịa.
Akụkọ bànyere ọnwụ nwa amadi ahụ bụ nke malitere wusàba nso nso a n’usoro mgbasa ozi, ma bụrụ nke kọwara na ya bụ nwoke gbara afọ iri asatọ na abụọ nwụrụ ka ọ rịachara obere ahụ.
Ozi e nwetara na-akọwa na n’ihi asịrị ahụ, na isi ọchịchị steeti ahụ akpọtụrụla isi ụlọ otu jikọtara ndị mgbasa ozi bụ N.U.J. iji gwa ha na nwa amadi ahụ dị ndụ, na ọ nwụghị anwụ ọbụla dịka ndị ahụ eziokwu gwụgoro n’ọnụ si akọsasị
Ha kpọkuzịkwara ndị nta akụkọ na ndị ọzọ na-efesàsị akụkọ ahụ, ka ha sepụ ọnụ na asịrị ahụ ma were oge ha mere ihe, tupu mmadụ arahụọ ebe o kwesighị ịrahụ.