MGALABA na-ahụ maka erimeri na ọgwụ na South Korea, a maala ọkwa ma dọọ ndị Nigeria aka na ntị ka ha ghara ịnabata ọgwụ nke e si China ebubata n’ịhị na ha nwere ịke ịnwe anụ ahụ mmadụ n’ime ha.
Ngalaba ahụ dọrọ aka na ntị a site n’edemede ‘memo’ nke ha ziteere ngalaba di iche iche n’ala Nigeria bu ndi na-ahu maka ndụ na ahụike dịka ndị Nigeria Intelligence Agency (NIA); Ngalaba na-ahu maka ahụ ike; NAFDAC; NDLEA na ọtụtụ ndị ọzọ.
Ọ bụ ka ọnwa ọktoba dị na mkpụrụbọchị iri na abụọ ka ha zitere ozi a. Ha kwuru sị na ọgwụ ndị e si China ebubata Nigeria nwere anụ ahụ mmadụ n’ime ha. Nke a pụtara na ọ bụ anụ ahụ mmadụ ka e jiri lụọ ogwụ ndị ahụ.
Dịka ha siri kwu, ọgwụ ndị ahụ bụ nke a na-ekwu na ha ga-eme ka mmadụ gbasie ike ma na-agwọkwa orịa dika, ‘cancer’ na ọrịa mamịrị bụ ‘diabetes’.
Ha gara n’ihu kọwaa site n’ozi ahụ na ‘South Korea Ministry’ chọpụtara na ọgwụ ndi ahụ nwere nde kwuru nde nje nke ga-ebute nnukwu mmebi n’ahụ ịke mmadu. Ha si otu a gwa ndị ahụ ọ dị n’aka na Nigeria ka ha dọọ ndị ala a aka na nti ka ha zeere ọgwụ ndị ahụ. Otu ahụ gakwara n’ihụ rịọ otu dị iche iche na-ahụ maka ibubata ibu na Nigeria ka ha kee nkwụcha chebiri ụgbọ ndị na-ebubata ọgwụ na Nigeria. Ozi ahụ kọwara na ndị ọlụ ‘Customs Service’, South Korea, anwụchikọọla ma kpọchie imirikiti ọgwụ adigboroja ahụ nke dị n’ụdịdị ọgwụ dị ịche ịche na ọgwụ rọba nke e ji akụkụ ahụ mmadụ mee ma bụrụkwa nke e sị mba China wee bubata n’ala ha.
Mgalaba ahụ na-ahụ maka erimeri na ọgwụ maka ahụ ike mmadụ na South Korea kwuru hoo haa na ha chọputara na ọgwụ ndị ahụ nwere nje pụtara ijeri iri na asatọ na nde narị asaa, ndị gụnyere nje na-ebute ọrịa ọcha n’anya ‘hepatitis B’ a hụrụ n’ime ọgwụ rọba ndị ahụ.
Ha kwuru na ọgwụ ndị e ji ahụ mmadụ wee lụọ adighi mma ka a ñụọ ha n’ihi na ha megidere mmadụ ma bụrụ nke ga-ebute nsogbu di ịche ịche n’ebe ahụ ịke mmadụ dị.