OTU ụlọelu nwere okpukpu atọ adaala n’Okpuno, Otolo Nnewi n’okpuru ọchịchị Nnewi North na steeti Anambra ma gbuo ndi ọlụ mmadụ atọ; ebe mmadụ asatọ nwetere mmerụ ahụ.
Ụlọelu ahụ, nke onye nwe ya bụ Maazi Avoji Collins, bụ nke e kwuru na ọ dara mgbe enweghị onye lebere anya n’ihi na o nweghị ka o siri gosi na o nwere nsogbu n’ụzọ ọbụla.
Onye na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii na steeti Anambra bụ SP Haruna Mohammed, bụ onye kwetara na nke e mere eme, kọwara na ndị uweojii gbatara ọsọ enyemaka na ya bụ ọdachi.
Dịka o siri kwu, igwe ndị uweojii ‘Police Patrol team’ nke onye ndu ha bụ onye kọmanda n’ebe ahụ ‘Nnewi Police Area Commader,’ ACP Nnaama Amah na ọtụtụ ndị enyemaka ndị ọzọ wụchara ebe ahụ ma zọpụta mmadụ iteghete n’ime ndị ọlụ iri na otu bụ ndị ụlọ ahụ dagidere.
Otu n’ime mmadụ iteghete ahụ ka e kwuru na o mechaara nwụọ n’ụlọọgwụ, nke mere ka ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ dịzịa atọ.
Ndị ahụ ụlọ dagidere ka e kwuru na ha tọrọ n’ebe ahụ ruo ihe dịka awa iri na abụọ tupu ha enweta enyemaka.
Kọmishọna ndị uweojii na steeti Anambra bụ Maazi Garba Umah, bụ onye mechaara bịa n’ebe ahụ njinji jiri kwuru na ya bụ ọdachị bụ nke a kaara igbochi ma ọ bụrụ na e leruru anya wee mee ihe otu o kwesịrị.
Ọ gakwara n’ihu kwuo na ya bụ ihe merenụ bụ ihe ịdọ aka na ntị. Ọ dụrụ ọdụ ka ndị ọ dị n’aka leruo anya iji wee hụ na e ji ihe kwesịrị ekwesị alụ ụlọ.
Otu o sina dị, ọ kọwara na osote kọmishọna ndị uweojii nke na-ahụ maka ụdị ihe ahụ abụrụla onye a hafeere nnyocha n’aka ka o leruo anya ma chọpụta ụzọ ya bụ mmiri si baa opi ụgbọgụrụ.
Ka ihe siri gbata kwụrụ ugbua, ndị uweojii nọzi n’okirikiri ahụ iji gbochie ndị mmadụ ibukọrọ ngwongwo e ji alụ ọlụ ebe ndị meruru ahụ na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ.