AGỤMAGỤ ọdịnala bụ agụmagụ si n’aka fere aka. Ọ bụ agụmagụ dị ọkpụ nke si n’aka nna nna anyị ha wee rute anyị aka. Ọ na-esi n’otu ọgbọ gafere n’ọgbọ ọzọ.
O nweghị otu onye a ga-asi na ọ bụ ya nwe udị agụmagụ ọdịnala ọbụla n’ihi na mgbe e chepụtara ha, edeghị ya ede.
Agụmagụ ọdịnala dịka anyị maara gụnyere akụkọ ifo, ilu, agwụgwa, akpaalaokwu, w.d.g. N’ihi na edeghị ya ede oge e chepụtara ya, ọ na-enwe mgbanwe. Ọ na-enwe ntinye ma ọ bụ nwepụ n’ebe ụfọdụ. Iji maa atụ, ọtụtụ akụko ifo na-abụ otu mana otu e si akọ ha na-adị iche iche.
Ihe kpatara nkea bụ n’ihi na ebe ọ bụ site n’ọnụ fere n’ọnụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-eme ntinye ma ọ bụ mwepụ na ha.
Agụmagụ ọdịnala na-ebu ndị a na-ewepụtara ya n’obi. Iji maa atụ, n’ihi akụkọ ifo bụ maka ụmụaka kpọmkwem, asụsụ e ji akọ ya na-adị mfe; agwa ndị na-abata na ya na-adị olemole. A bịa n’egwu mọọbụ abụ, a na-ebupụtara ọhaneze, tụmadi ndị katarala ahụ, mgbe ụfọdụ ọ na-ebu ὶkpè nke ilu na ụkabụilu na-ejupụta na ya.
N’oge mbụ, anaghị ede agụmagụ ọdịnala ede, mana ka ọ dị ugbua, a na-edezi ya ede, na-eme ya n’igwe okwu redio ma na-egosikwa ya n’onyoonyoo.
Agụmagụ ọdịnala bara ọtụtụ uru. E si na ya egosipụta omenala, e ji ya azụlite ụmụaka n’ụzọ dị iche iche dịka ịgba mbọ ime ezi omume. Site n’agụmgụ ọdịnala, ndị mmadụ na-enwe mmasị ịlụ ezigbo ọlụ n’obodo; e sikwa na ya enweta obi añụrị; e ji ya anọrị oge ezumike.
N’ikpe azụ, ma onye maara akwụkwọ, ma onye na-amaghị na-esonye n’ụdị agụmagụ a.
Ebumnobi bu imata isiokwu ohuru e nwere maka taam o bula na afo o bula.