OTU nwoke ka e jidere ebe ọ na-adakpo nwa ologbo (cat) onye agbataobi ya na South Africa.
Onye nwe nwamba ahụ chọpụtara nke a ka ọ nụrụ ebe nwamba ya na-eti mkpu na-ebe akwa, nke mere na ọ chọrọ ya n’ụlọ onye agbataobi ya wee hụ ka o na-akwasa ya iko n’ike.
Onye okwupụta okwu otu ndị ọlụ nchekwa nnọọrọ onwe ‘Reaction Unit South Africa’ bụ Prem Balram, onye ndị ọlụ ha zara ya bụ oku kwuru na nwoke ahụ na-agba mbọ iyinye akwa ya oge ndị ọlụ ha bịara.
O kwuru si “Ndị ọlụ nchekwa batara n’ụlọ ahụ ma jide nwoke ahụ ka ọ na-eyinye akwa ya,ebe ajị nwamba jupụtara n’ọbante (pant) ya. A kpọpụrụ nwoke ahụ na ya bụ ebe n’ihi mkpesa ndị agbataobi nyere maka ọdị mma nke ụmụ ha.”
Ọ gakwara n’ihu kwuo na adịla na mbụ jide nwoke ahụ ebe ọ na-akwasa nkịta na ụmụ nwamba iko n’oge gara aga mana e meghị mkpesa obala n’aka ndị ọ dị n’aka n’ihi arịrịọ enyi ya nwaanyị rịọrọ.