ONYE isi ụlọ ọlụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’ bụ Sir Chuka Nnabuife, ndị isi ngalaba ọlụ, enyemaka gọvanọ na ANPC bụ Fanny Oguine nakwa ụfọdụ ndị ọlụ nọ na nso nso a mee mmemme iguzobe ngalaba ọgbakọ ọmụmụ ihe na nkuzi gbasara otu e si alụ ego ma mmadụ laba ezumike nka n’ọlụ oyibo.
Onye isi ụlọọlụ a bụ ‘Sir’ Chuka Nnabuife kwuru n’ọgbakọ ahụ bụ maka ọzụzụ na nkuzi nye ụfọdụ ndị ọlụ ANPC, otu ha ga-esi na alụ ego ndị na-ala ezumike nka. Ọ gara n’ihu kwuo n’ọzụzụ a ga-ewe otu ọnwa. O kwuru na Gọvanọ Willie Obiano wepụtara akatamkpo ego iji kwado ndị ọlụ ANPC na ABS lagworo ezumike ọlụ kemgbe ọtụtụ afọ.
“Nsogbu anyị nwere ugbua bụ otu a ga-esi kwụba ndị nile lagworo ezumike nka ụgwọ. Anyị erugo ogo ịma otu a ga-esi na-alụ ego ndị a lagoro ezumike ọlụ, marakwa ego ole a ga-akwụ onye ọbụla mana anyị enweghị ndị maara ka a ga-esi lụọ ma gbakọkwa ihe onye ọbụla dịka ogogo ya si dị. Ndị e nyere ọzụzụ maka ịgbakọ na ịlụ ego dị otu a enyefenwughị ọzụzụ ahụ n’aka ndị ọzọ tupu ha laba ezumike nka. Nke a wee bụrụ ihe mfiahụ nye ụlọọlụ anyị ugbua”.
Onye isi kwuru na ọ bụ ndị ka nwere ogologo afọ ịlụ ọlụ ka a ga-enye ọzụzụ dị otua. Ọzụzụ nkuzi a ga-eme ka ụlọ ọlụ a na-aga nke ọma nke mere na a a ga-amụ ọzụzụ a otu ọnwa.
Onye enyemaka gọvanọ na ANPC bụ Oliakụ Fanny Oguine, n’okwu ya gwara ndị ọlụ na ihe onye isi chọpụtara dị mma nke ukwu ma burụ ka ọ diri onye ọbụla nwetara ọzụzụ nkuzi na Ulọ ọlụ ANPC mma na ọdịniru.
Onye isi ngalaba ọlụ bụ Ifeanyi Onwuta, n’okwu ya, kelere onye isi ụlọ ọlụ, ma kwukwa n’ozụzụ a dị mma nke ukwu nye ndị ngalaba ‘Accounts na Admin’ maka na ngalaba abụọ ahụ n’alụkọ ọnụ.
Comrade Jude Anadi, onye lagoro ezumike ọlụ na ngalaba na ahụ maka ndị lagoro ezumike, bụ onye isi nkuzi ihe ọmụmụ a, kwuru na ya anọgọ na ọlụ a ọtụtụ afọ. Ọ sịrị na obi dị ya ụtọ na ndị ANPC na anata ego ma ha lụsia ọlụ ugbua, ọkachasi ‘gratuity’ ha dịka ọ dị ugbua. O kelere ‘Sir’ Chuka na mbọ ya nile n’ime ụlọ ọlụ ahụ.
Nwamadi Jude kwere nkwa na ya ga agba mbọ ka ndị ọ na-azụ n’ọmụmụ ihe mgbakọ a mụta ya nke ọma.