IDE mmiri eriela nwata nwoke gbara afọ iri abụọ n’Ogbetiti Odoekpe dị n’okpulo ọchịchị Ogbaru, nke aha ya bụ Ifejika Umuiza.
Onyeisioche ‘Transition Committee’ nke okpuru ọchịchị Ogbaru, Arinzechukwu Awogu, kwupụtara nkea n’Awka na Tuzdee. Awogu kwuru na mmiri buuru Ifejika tunye ya n’ime nnukwu ọdọ mmiri nke dị n’akụkụ ezinaụlọ ha nke dị n’Ochuche Umuodu, Ogbetiti Odaekpe, ebe ha bi.
Ya bụ onyeisioche kwuru na ya na ndị ọzọ gọọmentị họpụtara akpọtụrụla ezinaụlọ ahụ ma tie ha aka n’obi maka ya bụ ọdachi.
O wutere ya na ha atufuola ọtụtụ ndụ n’ebe ahụ maka ide mmiri.
Ọ gara n’ihu kwuo na ọnụọgụ ndị tufuru ndụ ha n’ọnọdụ ahụ dịzi iri na otu. O kwuru si, “mmiri riri Ifejika n’akụkụ ezinaụlọ ya ebe ide mmiri dị n’azụ ụlọ ha buuru ya tunye n’ime ọdọ mmiri dị ebe ahụ. Nke a mere n’Ochuche Umuodu.
“Ọnwụ Ifejika wetara ọnụọgụ ndị mmiri rigworo kemgbe afọ 2018 nsogbu a bidoro n’ogo iri na otu.”