A KỌWAALA mmadụ inyocha ara ya na akụkụ ahụ ya ndị ọzọ nke ọma na oge ọbụla dịka ụzọ pụtakarịchara ìhè a pụrụ isi gbochie ọrịa nrechasị ahụ bụ ọrịa kansa ka ọ ghara ịgbasàwànyè.
Nke a bụ nke e mere ka a mara n’ọgbakọ nkuzi otu ụbọchị a chịkọbara maka ụmụ agbọghọ na ụmụ akwụkwọ ụmụnwaanyị, bụ nke a kpọrọ “Onyebuchi Chris Ifediora Foundation Health Symposium”, agba nke abụọ ya, bụkwa nke weere ọnọdụ n’ụlọ akwụkwọ ‘Stella Maris Secondary School’ dị n’Umueri ,n’okpuru ọchịchị Anambra East nke steeti Anambra.
Ya bụ ọgbakọ nkụzi, nke isi okwu ya gbakwasara ụkwụ n’igbòchi ọrịa nrechasị ahụ bụ kansa, dọtara ụmụakwụkwọ nọ n’ogo dị elu site n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị niile nke gọọmenti dị na mpaghara Otuọcha, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee tọsàá ma kọwasịara ha ihe dị iche iche iche mmadụ kwesiri ịma banyere ọrịa nrechasị ahụ, ihe na-akpata ya, otu e si ama ya, na otu a pụrụ isi gbanarị ya.
N’okwu ya n’ogbakọ nkuzi ahụ, nwunye aka na-achị steeti ahụ, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ Dọkịta Chiọma Ezenyimụlụ, tòrò ezi agbam mbọ nke nwa amadi nwe òtù nnọrọ onwe ahụ, bụ Dọkịta Chris Ifedịọra n’ịkwalite ezi ọnọdụ ụmụnwaanyị, bụ nke ọ kọwara dịka nke na-agbasò ezi ebumnobi nke ọchịchị Govanọ Willie Obianọ na òtù ya onwe ya ahụ bụ CAFE, ma kpọkuziekwa ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ ka ha ñomie ezi akparamagwa ya bụ nwa amadi iji mee ka steeti ahụ magbuo onwe ya.
N’okwu nkè ya, ya bụ nwa amadi chịkọbara ọgbakọ ahụ, bụ Dọkịta Chris Ifedịọra kọwara ezi ọnọdụ ahụ ike dịka otu n’ime ihe ndị kaachasị mkpà na ndụ mmadụ, ma kọwaa nke ahụ dịka otu n’ime ihe ndị na-akpali mmụọ ya n’ihe ahụ ọ na-eme. O kwekwazịrị nkwà na ọ ga-aga n’ihu n’ịgbanwe ọnọdụ ụmụ mmadụ na inyekwu ọtụtụ ndị mmadụ òhere agụm akwụkwọ n’efu, ọ kachasị ndị bi n’ime ime obodo.
N’ozi ọ gụpụtara n’ihe mmemme ahụ, onyeisi ụlọ ọlụ na-ahụ maka agụm akwụkwọ ogo sekọndịrị na steeti ahụ, bụ ‘Lady’ Joy Ụlasị, mere ka a mara na ịzụ mmadụ n’akwụkwọ chọrọ mmekọrịta na njikọ aka ọnụ, n’ihi na naanị gọọmenti apụghị ime nke ahụ. Ọ dụzịrị ndị nwere ihe ọ ga-éwè, ka ha na-atụnye ụtụ nke ha n’ịkwàlite ezi ọnọdụ ahụ ike na agụm akwụkwọ na steeti ahụ, ka ụmụ na-eto eto wee na-erita ọtụtụ uru dị na ya.
Na nkuzi o nyere, otu nnukwu onye ahụike nyere nkuzi n’ebe ahụ, bụ Dọkịta Emmanuel Azụbuike kọwara ihe dị iche iche na-ebute ụdị ọrịa nrechasị ahụ dị iche iche e nwegasịrị, kọwaa njirimara ha, ihe ọ pụrụ iwètara mmadụ nakwa otu a pụrụ isi wee gbanarị ha.