Ụlọ akwụkwọ Igwebuike agbaala afọ iri isii

0
899

N’IHI na a sị na ụsụ gbara afọ abụghịzị nwa ụsụ, ụlọ akwụkwọ ‘Igwebuike Grammar School’ dị n’Awka emeela mmemme ọgbụgba afọ isii o jiri màlite.

Nnukwu mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ogige ụlọ akwụkwọ ahụ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche gụrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ ndị bịara isonyere ya bụ ụlọ akwụkwọ wee ñụrịa nakwa igosipụta nguzosi ike ha n’inye ya bụ ụlọ akwụkwọ nkwàdo.

Dịka ọ na-ekwu okwu na mmemme ahụ, onyeisi otu jikọtara ndị gụbụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ ndị a maara dịka ‘Old Boys Association’, bụ Maazị Emmanuel Nwobu, kọwara mmemme ahụ dịka oge ịñụrị ọñụ na oge mbịakọta ọnụ, bụ nke o kwuru na ọ ga-enye aka n’ịkwalite mmekọrịta ha na ụlọ akwụkwọ ahụ n’ụzọ ga-eweta ezi ọdịmma nke ụlọ akwụkwọ ahụ ma mekwa ka ùgwù ya ahụ e jiri mara ndị gụrụ ebe ahụ n’oge mbụ guzosikwa ike n’ebe ndị na-agụ ebe ahụ ugbu a nọ.

Ọ kpọrọ oku maka enyemaka gọọmenti n’ụfọdụ mkpa dị iche iche ụlọ akwụkwọ ahụ nọ na ya, nke gụnyere ịgba ogige na enweghị ndị nkuzi.

N’okwu nke ya, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ onyeisi ọlụ oyibo na steeti ahụ, bụ Ọkaiwu Harry Ụdụh, tụụrụ ụlọ akwụkwọ ahụ mmamma n’ọgbụgba afọ iri isii ya, ma tòkwa ndị otu ‘Old Boys Association’ n’ihi ọlụ dị iche iche ha rụgoro n’inwogharị ụlọ akwụkwọ ahụ ka ọ nọrọ n’ogoogo dị elu.

Ọ kpọkuzịkwara ndị ọzọ Chukwu gọziri n’ụzọ dị iche iche ka ha na-echeta ebe ha gụrụ akwụkwọ ma na-atụnyekwa ụtụ nke ha n’ịkwàlite ya na ọnọdụ agụm akwụkwọ na ya.

N’otu aka ahụ, Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka agụm akwụkwọ, bụ Ọkammụta Kate Omenụgha, kelere ya bụ ụlọ akwụkwọ na ndị otu ahụ jikọrọ ndị gụrụ akwụkwọ n’ebe ahụ, ma kọwaa nkwalite agụma akwụkwọ dịka ihe dịịrị onye ọbụla, na-abụghị naanị gọọmenti dịka ụfọdụ si eche.

Na mbụ n’okwu ya, onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ Maazị Richard Anekokwu, kọwara ịgba mbọ nke ndị ahụ gụrụ akwụkwọ n’ebe ahụ dịka otu n’ime ihe nyegoro aka kwàlite ọnọdụ mmụta na òtútó nke ụlọ akwụkwọ ahụ na aha ọma dị iche iche o nwetagoro.

O tokwara gọọmenti steeti ahụ n’ihi ịgba mbọ esepughị aka ya n’ịkwalite ọnọdụ mmụta, bụ nke ọ sị na ụlọ akwụkwọ ahụ eritela ọtụtụ èrèrè n’ime ya.

Ụlọ akwụkwọ ahụ bụ nke a chọpụtara n’ahọ 1958, ma bụrụkwa nke zụpụtagoro ma ka na-azụpụtakwa ọtụtụ ndị dị iche iche e ji ama àtụ na ngalaba dị iche iche, ma bụrụkwa ụlọ akwụkwọ e ji ama atụ ugbu a n’ituru ùgò na asọmpi na ule dịgasị iche iche a na-ele n’ala Nigeria.

A nọrọ na mmemme ahụ gbapee ihe dị iche iche iche a rụrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ site n’aka ndị ahụ gụrụ akwụkwọ ebe ahụ n’oge gara aga, nke gụnyere ọmarịcha ọnụ ụzọ ama ọgbara ọhụụ, osisi dị iche iche ha kụrụ akụ, tinyere ihe ndị ọzọ.

A nọkwazịrị na ya wee gbaa ọnya ego maka ọrụ ndị ọzọ dị iche iche e ji n’aka n’ụlọ akwụkwọ ahụ ugbu, ma nyegasịkwa onyinye na ihe nrita dị iche iche nyegara ụmụ akwụkwọ ụlọ akwụkwọ ahụ na-emegasị ma ọ bụ mere nke ọma n’agụm akwụkwọ ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here