DỊKA a sị na onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; ụmụnwaanyị obodo Oko dị n’okpuru ọchịchị Orumba North nke steeti Anambra ehorola ntùtù taa, sị na ha ga-akwapụ n’obodo ahụ kpamkpam ma ọ bụrụ na gọọmenti na ndị ọchịchị amàchighị ikpo aja ahụ a na-ekpo na mpaghara ahụ ma ọ bụ nwụchikọọ ndị niile na-ekpo ya bụ aja.
Nke a bụ nke ụmụnwaanyị a mere ka a mara site na ngagharị iwe ha mere n’obodo ahụ nso nso a, bụ nke ha nọrọ na ya wee kpọọ ganị ganị n’ụdị dị iche iche wee katọọ ma megide ya bụ ikpo aja na-ewu èwù a na-ekpo n’obodo ahụ.
Ya bụ ngagharị iwe bụ nke ha nọ na ya wee gụọ ọtụtụ egwu dị iche iche megide ya bụ okwu a kpụ n’ọnụ, ebe ụfọdụ n’ime ha bugasịkwa akwụkwọ e dere ihe dị iche iche, dịka “Kwụsị nụ Ikpo Aja n’Obodo Ayị”, “Ụmụ Anyị Enweghịzị Ebe Ha Ga-Ebi” “Ikpo Aja na Idè Emebichaala Ala Oko”, “Ikpo Aja Emeela Ka Ala Dị Oke Ọnụ Ahịa n’Oko”, “Ala Adịghịzị n’Oko” tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ e degasịrị n’akwụkwọ ha bù.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, onye ndu ụmụnwaanyị ahụ, bụ Oriakụ Maureen Izuegbunam kwuru na o teela ha siri tibe mkpu bànyere ajọ ọnọdụ ahụ, mana ha chọpụtara na ọ dị ka a ga-asị na nke ahụ bụ iticha aka n’akpụkpọ ehi, bụzị nke mere ha jiri wee nuputa n’ìgwè iji gosi ụwa ka obi dị ha banyere nke ahụ nakwa ime ka ọha mmụọ na ọha mmadụ mara mkpebi ha, ma ọ bụrụ na e meghị ihe e kwesiri ime.
N’okwu nke ya banyere nke a, onyeisi ọchịchị obodo Oko, bụ Maazị Cyprain Nwamụọ katọrọ ya bụ ikpo aja, ma kwuwaa hoohaa na ha agaghị agbazị nkịtị kụkọsịa aka na-ele ka ụfọdụ ndị mmadụ ma ọ bụ mbìze chụsịa ha n’obodo ha n’ihi ikpo aja, maka na ya bụ mbìze na-aga n’ihu na-agbasàwanye n’ike n’ike, nke pụtara na o nwere ike ịchụsịsị ụmụafọ obodo ahụ oge adịghị anya.
Ọ kọwara na ụlọ ọlụ NEWMAP etinyela anya n’ọnọdụ ahụ iji wee bèlata mgbasawanye nke mbize ahụ, mana ha kwuru na a ga-akwụsịrịrị ikpo aja n’ebe ahụ tupu ihe ọbụla enwee isi, bụkwanụ nke ndị obodo ahụ akwụsịbèghị n’ihi oke ọnụ ọgụgụ nke ndị na-ebì aja ebe ahụ kwa ụbọchị ọbụla.
Otu onye selitere isi n’obodo ahụ, bụ Maazị Ernest Nwosu mere ka a mara na ikpo aja na mpaghara ahụ na-adọghàchi aka elekere azụ na mbọ gọọmenti na-agba iji kpàá mbize ahụ eze, ma kọwapụtakwa mbọ dị iche iche gọọmenti na ndị obodo ahụ gbàgòrò iji weta ọnọdụ ahụ n’isi njedobe.
Na ntụnye nke ya, onyeisi oche nchere ogè n’okpuru ọchịchị Orumba North, bụ Oriakụ Ify Obinabọ rịọrọ ụmụnwaanyị ahụ doo ka ha wetuo obi banyere nke ahụ, ọbụnadị dịka o kwere ha nkwà na ya onwe ya ga-elebà anya n’okwu ahụ iji hụ na e mere ihe e kwesiri ime n’oge adịghị anya, dịka ọ rụtụụrụ ha aka na ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ bụ nke na-enwe mmetụta n’ihe gbàsaara ọnọdụ ụmụ mmadụ na-agabiga.