NJINJI jiri n’Umudioka Awka nke dị n’okpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra na Tọzdee izuụka gara aga ebe aka otu nwoke tọrọ n’ime tankị mmanụ ụgbọala ebe ọ gara ohi mmanụ ‘diesel’.
Nwoke ahụ, aha ya bụ Anayo Igwendu, ma bụrụ onye gbara afọ iri abụọ na isii bụ onye steetị Enugu. Ọ bụ n’elekere nke abụọ ụzọ ụtụtụ (2am) ka ọ gara n’ebe ụgbọala ahụ dị wee malite iku mmanụ ụgbọala.
Otu onye ọnọ ka o mere kwuru na ọ bụ mgbe o kutechara mmanụ ma chọzia ka o were ihe ‘foam’ hichatachaa mmanụ ahụ nke ọma ka aka ya ji tọkiri n’ime tankị ahụ.
Mgbe ọ nwara oko ya ka o wepụta aka ya ma okweghị ya ka o jiri gbaa onwe ya ama site n’itiku ọha na eze ka ha bịa zọpụta ya.
Ọ gara n’ihu kwuo wee sị; “Anyị nụrụ mkpu ọ na-eti wee gbara bịa wee hụ ebe eke na ihe o loro wụsa. Otu onye n’ime anyị wetere akọrọngwa e ji alu ụdị ọlụ ahụ ‘chisel’ nke anyị ji wee bepụta tankị ahụ n’ụgbọala, nke mere ka o buru aka ya na akụkụ tankị ụfọdụ na-agagharị.”
E mechaara kpọrọ onye ohi ahụ gaa n’ụlọ ezumezu obodo ahụ ebe ọha na eze nọ wee gbaa ya nkiri.
N’okwu nke ya, onye nwe ụgbọala ahụ aha ya bụ Onyebuchi kọwara ihe ahụ merenu dịka akaọlụ Chineke, ma kwuo na ọ bụ n’ihi ekpere na ebumonu o mere n’ụbọchị gara aga.
O kwuru na ya bụ ihe abụrụla ihe idọ aka na ntị nye ndị ọchọngaloko nọ n’ogbe ahụ.