
STEETI Anambra eguzobela amụma ọlụ nchekwa pụrụ iche maka ọnwa ‘mber’ iji hụ na e nwere nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ n’ime ọnwa ‘mber’ a nọ n’ime ya.
Mmemme igùzòbe ya bụ amụma ọlụ nchekwa bụ nke weere ọnọdụ ụbọchị Mọndè, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu na ngalaba ọlụ nchekwa na steeti ahụ.
N’okwu ya, dịka ọ na-egùzobe amụmà ahụ, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kọwara na ebumnobi nkè ahụ bụ iji wèta ezi nchekwa na gburugburu niile nke steeti ahụ, site na ngagharị ndị ọlụ nchekwa n’ebe dị iche iche oge ọbụla, inyochasị ihe na ebe kwesiri na ebe dị àñaa, ma na-etinyekwa atụmatụ ọlụ nchekwa dị iche iche n’ọlụ, ọ kachasị ugbu a oge ekeresimeesi na-akpụdòbe nso.
O mere ka a mara na ọchịchị ya amalitela itinyesi akụrụngwa nchekwa bụ CCTV karịrị puku iri ise n’ọnụ ọgụgụ n’ọtụtụ ebe dị iche iche na steeti ahụ, nke a ga na-eleru anya site n’aka ndị ọkachamara, bụkwa nke ga-enye aka inyòpù na igbòchi mpụ na arụrụ ala.
Ọ kpọkuzịrị ụmụafọ steeti ahụ bi n’ebe dị iche ka ghara ịtụ egwu ọbụla n’ịbata ụlọ n’oge ekeresimeeri a, maka na egwù ọbụla adịghị.
N’okwu nke ya, kọmishọna ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Garba Umar kọwara na ya bụ nhàzi ọrụ nchekwa pụrụ iche maka ọnwa ‘mber’ bụ nke a malitere kemgbe ọnwa Septemba afọ a, ma sịkwa na e wezuga iwèta ezi ọnọdụ nchekwa, na atụmatụ ahụ ga-enyekwazị aka n’ụzọ pụrụ iche iji hụ na nsògbu ọbụla adapụtaghị, ọ kachasị nke a na-akwado achụm nta nkwàdo maka nhọpụta izugbe ala anyị.
Na ntụnye nke ya na mmemme ahụ, osote onyeisi ndị uwe ojii na-elekọta mpaghara ‘Zone Nine’, bụ Maazị Hosea Karma kwuru na nke ahụ bụ nnọọ nzọpụ ụkwụ dike ọzọ pụrụ iche n’agbam mbọ ọchịchị Gọvanọ Obianọ n’iwètara ndị Abambra ezi nchekwa tọrọ àtọ na ime ka steeti ahụ bụrụ eji ama àtụ n’ihe gbasaara ọnọdụ nchekwa n’ala anyị.
Site n’aka Gọvanọ Willie Obianọ, a nọrọ na ya bụ mmemme wee bunye ndị ọlụ uwe ojii ọgbaatumtum karịrị iri ise n’ọnụọgụ, iji wee kwàlite ọlụ ha ịgazù n’ime ime obodo dị iche iche. Site n’aka ya bụ gọvanọ, e nyekwara ọtụtụ ihe nrita na ihe onyinye dị iche iche nyegara ụfọdụ ndị ọlụ nchekwa gosipụtagoro onwe ha dịka ndị pụrụ iche n’ịlụ ọlụ ha, tinyere nwunye ndị ọlụ uwe ojii nwụrụ n’ọlụ, bụ ndị e nyekwara onyinye ego nkwàdo dị iche iche.