ANPC amalitela inye ndị ọlụ ọzụzụ maka ịgbasa ozi n’ịnteneti

0
663

ỤLỌ ỌLỤ Anambra Newspaper and Printing Corporation, bụ ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra amalitela inye ndị ọlụ ya nkuzi na ọzụzụ pụrụ iche n’usoro mgbasa ozi ọgbara ọhụụ.

Ya bụ ọzụzụ bụ nke ga-ewe mkpụrụ ụbọchị atọ ma bụrụkwa nke ga-akụrụ ọnụ echi bụ Frayịdee.

N’okwu ya na nkenke ọgbakọ a chịkọbara iji gbapee amụmà inye ọzụzụ ahụ, onyeisi ụlọ ọlụ ahụ, bụ Maazị Chuka Nnabụife, kọwara nke ahụ dịka otu n’ime atụmatụ dị iche iche e ji n’aka ugbu a iji nwògharịa ya bụ ụlọ ọlụ ka ọ bụrụzie eji ama atụ.

O mere ka a mara na ihe na-ewuzị ugbu a na ngalaba mgbasa ozi bụ usoro dijitaalụ, bụ ụzọ ọgbara ọhụụ e si agbasazị ozi ugbu a, ma kọwaa na ụlọ ọlụ ọbụla na-esonyeghị ma ọ bụ banye na nke ahụ ozigbo ozigbo, ị mara na ahịa èkpùdola ya,

maka na ọ gaghị achịtazị aja na ngalaba ahụ ọzọ, dịka o siri metụta urù ahịa. Maazị Nnabụife mekwazịrị ka a mara na ụlọ ọlụ ọbụla apụghị ito ma ọ bụrụ na ndị na-alụ na ya etoghị, bụzị nke mere e jiri chepụta ma hazie inye ọzụzụ ahụ na ọzụzụ nke ọzọ ha màlitegoro,

bụ ikuzi otu e si agbakọ ego maka ndị lagoro ezumike nka, tinyere ọzụzụ ndị ọzọ ha ga-achịkọbakwa n’ọdịnihu, bụ nke ọ kọwara dịka nke ga-enye aka n’ụzọ pụtara ìhè ime ka mba ụwa mara ụlọ ọlụ ahụ na ihe ndị ha na-emepụta. O tokwazịrị aka na-achị steeti Anambra,

bụ Gọvanọ Willie Obianọ n’ihi mmasị ya na ezi agbam mbọ ya n’ịkwàdò, iwulite na inwòghàrị ụlọ ọlụ ahụ ka ọ nọrọ n’ogoogo mba ụwà.

GUO:  Ndị isi NUPPPPROW emeela njem nleta n’ANPC

N’okwu ha n’otu n’otu, ndị na-enye ya bụ nkuzi, bụ Maazị Emeka Iheonnnaekwu na Maazị Paul Nwankwọ, na ògbò ha nke na-akụzi maka otu e si ágbàkọ ego maka ndị lagoro ezumike nka, bụ Maazị Jude Aladị kọwara atụmatụ inye ọzụzụ ahụ dịka nke magburu ònwé ya,

tòó ụlụ ọlụ ahụ maka ịhụta mkpa nke ahụ dị, wee bido n’oge chụba ya; ma dụkwazie ndị ahụ a na-enye ya bụ ọzụzụ ka ha wère ohere ọma ahụ kpọrọ ihe, n’ihi ọtụtụ uru dị iche iche nke ahụ ga-ewètara ha, ọ bụnadị ma mgbe ha lụchara ọlụ dịka ndị nta akụkọ.

Onye nhazi akwụkwọ akụkọ ndị ụlọ ọlụ a (Editor) bụ Rose Oranye kelere Chukwu maka  mmemme ụbọchị ahụ ma kelekwa onye isi ụlọ ọlụ a bụ  Chuka Nnabuife maka ezi echiche ya nakwa ime ka nkuzi a bia dịka ọ dị taa.

O jikwa ohere a kwee nkwa n’aha ndị a ga-enye ọzụzụ ọmụmụ ihe a na ha ga-eme nke ọma iji kwalite ụlọ ọlụ a n’ịgbasa ozi.

Inye ọzụzụ ahụ bụ nke ndị sitere ngalaba dị iche iche nke ụlọ ọlụ ahụ na-esonye na ya, ma bụrụkwa nke a nọ na ya wee na-elebà anya n’ihe ọmụmụ:’ branding, online reporting, blogging, digital marketing, e-mail marketing’ na ọtụtụ ihe ọmụmụ ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here