DỊKA a sị na chi na-abọ, ihe ọma na ihe ọjọọ ana-abọ, ndị uwe ojii na mpaghara Obosi nke steeti Anambra ahụla ma bute mmadụ abụọ a na-enyo ènyò na ide mmiri gbàgbùrù na mpaghara Odume nke Obosi dị n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti ahụ.
Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Garba Umar, bụ nke ọ nọrọ na ya wee kọọ na a hụrụ mmadụ abụọ, otu nwoke na otu nwaanyị ka ha tọgbọ na mpaghara Odume ahụ, nke mezịrị ndị ọlụ uwe ojii na mpaghara Obosi ahụ jiri gbara gaba ebe ahụ ozigbo ozigbo.
Dịka o siri kwuo, ngwa ngwa ahụ, ha buuru mmadụ abụọ ahụ gaba n’ụlọ ahụike ‘Unity Hospital’, bụzị ebe dọkịta nọ wee lelechaa ha ahụ, ma fechaa isi, sị na ụkwa a na-apị, na mkpụrụ adịghị ya.
O kwuru na site n’obere nnyocha e megoro, na a achọpụtara na ọ ga-abụ idè mmiri gbàgbùrù ndị ahụ n’ihi oke mmiri ozuzo ahụ kwọsịrị n’ebe ahụ ụbọchị Satọdee, bụkwa nke gbara oke ide mere mkpamkpa na mpaghara ebe ahụ niile ụbọchị ahụ.
Maazị Ụmar jizịkwara ohere ahụ kpọkuo ndị bi na mpaghara ebe dị iche iche ide mmiri na-enyegasị nsògbu na steeti ahụ ka ha hàzigharịa ọnọdụ ha, iji wee gbanahị ihe egwù ma ọ bụ ihe ndapụta ọbụla.
Otu ọ dị, nke nwaanyị n’ime mmadụ abụọ ahụ, bụ onye e mechaara kọwaa dịka Oriakụ Ọlụchi Nwafọr, bụ onye ọlụ n’ụlọ ọba ego ‘First Bank’ dị na mpaghara Ọchanja nke Ọnịtsha.