NWATA nwoke Nigeria na-agba bọl aha ya bụ Ekundayo Ebenezer Mawoyeka anwụọla ka ọ na-agba bọl ubochi Satọdee na Turkey.
Ekundayo, onye gbara afọ iri abụọ na atọ bụ onye na-agbara Saraykoyspor na ‘Super Amateur League’ koropụrụ ma daa ka a gbara bọl nkeji iri atọ na ise n’ama egwuregwu ‘Servegazi Stadium’. Mgbe e buuru ya gaa ụlọọgwụ, ‘Servergazi State Hospital’ ka e kwuru na ọ nwụọla.
E kwuru na a kwusịrị ya bụ egwuregwu bọl ozugbo maka ọdachị ahụ.
Onye isi ‘Denizli Amateur Sports Clubs’ bụ Feyyaz Cesen kwuru na ọnwụ nwata nwoke ahụ bụ ihe nwute n’ebe ha nọ.