OTU a kpọrọ ‘Anti Piracy Society of Nigeria (APSON)’ wụchara n’ụlọ ọlụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), ndị na-emepụta akwụkwọ akụkọ National Light, Sports Extra na Ka Ọ Dị Taa na Tuzdee, maka ezi mkparịtaụka otu ha ga-esi nyụkọọ mamiri ọnụ ka o wee gbaa ụfụfụ.
Otu a bụ ndị na-ebu agha megide adịgboroja, dịka ịlughari aka ọlụ onye ọzọ (piracy) ma na-eri uru dị na ya.
Onye isi ndị otu ahụ bụ Frank Uduonu kọwara na njem ha bụ ka ha na ndị ANPC jikọọ aka ọnụ wee lụọ ya bụ agha ka obodo anyị wee dị mma tinyekwara na ha na-akwado ime mmemme n’Awka n’ọnwa a bụ Novemba.
Onye isi ụlọ ọlụ (Managing Director) ANPC bụ ‘Sir’ Chuka Nnabife nabatara ha ma jakwaa ha ike n’ihi mbọ ha.
Sir Chuka kọwara na ọ dị njọ bụ ụzọ dị iche iche e si egbu aka ọlụ mmadụ site n’ịlụgharị ya.
Ọ gara n’ihu gwa ha ka ha gbaa mbọ na-agbasa ozi ha iji mee ka ndị mmadụ mata ebumnuche ha. Ọ kwukwara na mmemme ahụ ha ga-eme bụ ohere ọma ha ga-eji gbaa ozi ha n’anwụ.
Mmadụ ise ndị otu ahụ biaranụ aha ha bụ Frank Udunu, onye isi oche zuzugbe; Nkem Emeodi, ode akwụkwọ, tinyere Dumebi Chukwuma; Okafor Chinenye na Nnamdi Moses ji obi añụrị kelee ‘Sir’ Chuka.
Onye nhazi akwụkwọ akụkọ ndị ANPC (Editor) bụ Rose Oranye, tinyekwara onye enyemaka Gọvanọ Obiano (SA) na ANPC bụ Fanny Oguine so wee nnabata ha.
Ka ọ dị ugbua, ha na-akwadosi ike maka nnukwu mmemme nke ga-enwere ọnọdụ n’ogige ANPC na Wenezdee, ọnwa Novemba a ga-adị n’ mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na otu ma ọ kuọ elekere iri nke ụtụtụ kpọmkwem.