DỊKA oge udummiri kwakọrọgoro ngwóngwó ya pụọ, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ emeela ka a mara na a ga-amalitekwa ọlụ n’okporo ụzọ dịgasị iche iche na steeti ahụ.
Gọvanọ Obianọ kwuru nke a oge ọ gara ịmara ka ọlụ si aga na ya bụ okporo ụzọ dị kilomita ise na ụma iri asatọ na atọ bụ nke dị n’Ụkpọr n’okpuru ọchịchị Nnewi South, ma bụrụkwa nke ọ sị na a ga-arụchapụ o pekata mpe, otu kilomita n’ime ya, tupuu oge mmemme ekeresimeesi ahọ a ebìnwuru ọkụ.
Ọ kọwara ya bụ ụzọ dịka nke jikọtara ime-ime ógbè na obodo dị iche iche, ma kwuo na ọ bụkwa nke ga-abà oke uru ma ọ bụrụ na a rụchaa ya.
Na ntụnye nke ya, dịka o siri gbasò ntụzi aka Gọvanọ Obianọ, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọlụ, bụ Maazị Marcel Ifejifọr nyere ndị niile ji ọrụ ngo dị iche iche na steeti ahụ iwu ka ha bukọrọ ngwongwo ha lachigha azụ n’ihu ọrụ ha ozigbo ozigbo ma màlitekwa ọlụ n’ihi na oge udu mmiri agafeela.
O kwuru na onye ji ya bụ ọrụ ngo okporpo ụzọ Malinze-Ugwuorie-Ụmụike-Ezinifite gachighara n’ihu ọrụ ya ozigbo udummiri kwụsịrị, bụzị nke mere o jiri nwee ike ikpochite kilomita abụọ na ụma iri asatọ na ise ugbu a.
N’akụkụ nke ya, onye ji ya bụ ọlụ ngo, bụ Maazị Philip Ekwempụ kwere nkwà na ha ga-emezù ntụzi aka Gọvanọ Obianọ site n’ịhụ na ha techara otu kilomita ụzọ tupuu à bànye n’oge mmemme ekeresimeesi kpọmkwem.
O kwuru na ya bụ ọlụ ngo nwekwara àkwà mmiri a ga-arụnye na ya, nke ogologo ya dị mítà iri, ebe obosara ya dị kilomita iri na ụma atọ, bụkwa nke o kwuru na ọ bụ site na ya ka a ga-esi agafe n’ụfọdụ ime-ime obodo dị na mpaghara ahụ.