DỊKA ọ bụ e tikọọ mkpu ọnụ, a nụ ụdà ya; a kpọọla oku maka ezi njikọ aka ọnụ nke gọọmenti na ndị otu nnọrọ onwe dịkà ụzọ pụtara ìhè a pụrụr isi kwàlite ezi ọnọdụ ahụike na mmepe obodo.
Osote aka na-achị steeti Anambra bụ Dọkịta Nkem Okeke kọwara mkpa nke a dị, ma kpọkwa oku a oge ọ gara ịmara ka ọlụ si aga na mwulite ahụ a na-ewulite ụlọ ahụike ọhaneze dị n’Enugu-Ukwu n’okpuru ọchịchị Njikọka steeti Anambra.
Ọ kọwara ezi ọnọdụ ahụike dịka otu n’ime ihe kachasị dị mkpa na ndụ mmadụ, maka na ọ bụ ndụ dị, e wee chụba àkụ, ma kọwaa na ọ bụ nkwenye ahụ mere ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ ji agbasi mbọ ike n’ịkwalite ọnọdụ ahụ ike ụmụafọ steeti Abambra, site na njikọ aka ọnụ ha na ntụnye nke otu nnọrọ onwe dị iche iche.
Dọkịta Okeke, onye kwuputara afọ ojuju ya banyere otu ọrụ ahụ si aga ebe ahụ gakwazịrị n’ihu gosipụta njkere nke gọọmenti steeti ahụ iweputa ego iji rụchapụ ya bụ ọrụ, na-agbanyeghị na ego so n’otu ihe na-eweta ‘agakata akwụsị’ n’ebe ọrụ ngó dị.
Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ ji ya bụ ọrụ ngo, nke onye nọchitere anya ya bụ Maazị Eric Nnajiụba mere ka a mara ihe dị iche iche gbasaara otu ya bụ ọrụ siri gbata kwụrụ n’ogoogo ọ nọ ugbu a. Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe iche aka mgba dị iche iche na-adọghachi aka elekere azụ n’ebe ya bụ ọrụ dị, ma kwuo na site n’enyemaka gọọmenti steeti ahụ n’ibèlata ihe iche aka mgba ahụ, na ha ga-arụchapụ ọrụ ahụ n’ahọ na-abịa abịa.
N’aha onyeisi nhazi n’ụlọ ahụike ahụ, Dọkịta Herbert Agbasị, bụ nnukwu onye ọrụ ahụike selitere isi n’ebe ahụ gosiputara ihu ọchị ya na obi ụtọ nke ụlọ ahụike ahụ, banyere otu ọrụ sikwara malite ebe ahụ ọzọ, ka ọ gachara ụfọdụ oge a kwụsịgodiri ya. O tokwazịrị ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ maka mkpebi ya, ịdị uchu ya na ezi agbam mbọ esepughị aka ọ na-agba n’ịkwàlite ezi ọnọdụ ahụ ike nke ụmụafọ steeti ahụ.