ỌCHỊCHỊ steeti Anambra na mbà China ezukọtala ịbụ ọgọ n’ihe gbasaara ịkwàlite njem nlegharị anya.
Nzukọta a na nkwekọrịta ‘ịgọ ọgọ’ a bụ nke pụtara ihe site na nkwà mba China kwere iwunye na igùzòbè ụlọ ọgbakọ égwú na steeti ahụ.
Ya bụ nkwupụta bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ihe e ji aka eme, ihe na-eme na mba ofesi, omenala na njèm nlegharị anya, bụ Ọkaiwu Sally Mbànefo, n’okwu ya na nzukọ isi ọchịchị steeti ahụ nwere n’Awka nso nso a.
Ọ kọwara ya bụ ndọta dịka nke magburu onwe ya, metụsịa aka n’ọtụtụ uru dị iche iche nke ahụ ga-eweta, ọ kachasị dịka o siri metụta ịkwàlite ọnụ ego steeti ahụ na iwulite ọnọdụ mmepe nke steeti ahụ.
Kọmishọna Mbanefo gara n’ihu kpọpụtasịa ọtụtụ ihe nrita dị iche iche na onyinye nkwanye ùgwù steeti ahụ nwetara nso nso a, nke gụnyere nturu ugo ahụ Gọvanọ Obianọ nwetara nso nso a dịka gọvanọ kacha akwàlite njem nlegharị anya, bụ nke o nwetara site n’aka ndị nnọrọ onwe; National Council for Arts and Culture’; tinyere ọtụtụ nturu ugo ndị ọzọ steeti ahụ nwetara.
O kwuru na ụlọ ọlụ ahụ ọ nọ n’isi ya na steeti ahụ agbaala ọtụtụ mbọ dị iche iche igosipụta ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Anambra na ndị Igbo n’izugbe, ma n’ime na na mpụga ala anyị, ma kwuo na nke ahụ bụ nnọọ ngosipụta mpụta ìhè nke ezi ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ.
Na nzaghachi dịka ọ na-anabata ihe nrita ndị ahụ, Gọvanọ Willie Obianọ tòrò minịstịrị ahụ maka ezi ịgba mbọ ya na ihe dị iche iche o mepụtagoro na nkenke oge a Oriakụ Sally Mbanefo nọgoro n’isi ya dịka kọmishọna.
O tokwara ya bụ kọmishọna n’ihi ịgba mbọ esepughị aka ya, bụ nke ọ kọwara dịka nke megoro ka ịma mma steeti ahụ chawapụtakwuo wee na-adọtakwuzị ndị na-esi mba dị iche iche abịa ewunye ihe nwunye.
Ọ kwuru na nke ahụ bụ ihe agbam ume iji rụrụ ọlụ gaa n’ihu, ma gakwazie n’ihu kpọkuo ya na ụlọ ọlụ ya ka ha jide ka ha ji, ọbụnadị dịka ọ kpọkukwazịrị ndị ọzọ ji ego achụ ego ka ha hụta ma tinye isi na steeti Anambra dịka steeti kacha mma maka ime nke ahụ.