OTU na-ebu agha emegide adịgboroja n’ala anyị nke a kpọrọ ‘Anti-Piracy Society of Nigeria’ emeela emume nke ha na-eme afọ ọbụla iji busoo ya bụ arụ agha nke afọ 2018. Isiokwu bụ ‘Envolving Challenges, Innovative Responses’.
E mere mmemme a n’ogige ụlọ ọlụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ‘National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra’.
Kọmishọna na-ahụ maka mmụta na ịkụzịrị ọha na eze ihe ha kwesịrị ịma bụ C. Don Adinuba bịara ma nye ha nkwado. O kelere ndị otu ahụ, tinyere ọha mmadụ juru ebe nile. O toro aka na-achị steeti Anambra Gọvanọ Willie Obiano maka ọlụ ọma na nkwado ya tinyere ịkwalite asụsụ na omenala Igbo. O kelere onyeisi ụlọ ọlụ ANPC bụ Sir Chuka Nnabuife maka ịgba mbọ ya nke mere ka ogige ahụ bụrụ ịgba.
Kọmishọna Adinuba kọwara na ibu agha megide adịgboroja bụ ọlụ dịịrị onye ọbụna n’ala Nigeria. O kwuru na o kwesịrị ka mmadụ rie ma ọ lusia ọlụ. “Ọtụtụ ndị mmadụ na-etinye ego bipụta akwụkwọ, bipụta egwu na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ma e mechaa ndị ọzọ erie uru ha kwesịrị iri.
Ndị a na-eme adịgboroja enweghị ihe ha na-etufu nke ha ji akwu takịsị”. O kwuru sị, “N’obodo oyibo dịka America, ndị mmadụ na-eri uru ọlụ ha afọ kwuru afọ mana ọdịghị otu a na Nigeria.
Adinuba gara n’ihu gwa ha na steetị Anambra dị njikere iso ha buo agha megide adịgboroja, gazuo ụwa nile iji kwụsị ya. Ọchịchị Chief Willie Obiano (Akpokuedike Global) na-akwado ihe dị mma mgbe nile.
O chetakwaara ọha mmadụ na nwa mgbe gara aga ka ụmụaka ụmụnwanyị gara obodo oyibo tulataara na steeti Anambara ugo.O kwukwara na steeti a nwere redio kacha mma bụ ‘Anambra Broadcasting Service (ABS)’.
Ọ rụtụkwara aka na onye bụ ọka ibe n’edemede n’Africa, Chinua Achebe bụ onye Anambra na mmadụ dịka Cyprian Ekwensi, tinyekwara ndị na-eme ejije dịka Pete Edochie. Ọ gara n’ihu kwuo si; “Anyi ga-emeriri ka otu a gaa n’ihu. Anyị chọrọ ka Achebe, Pete Edochie na ndị ọzọ nile na-eriterịrị uru n’ọlụ ha. Ndị ọlụ adịgboroja agaghị aghasa ọlụ ha, nke a agaghị eme n’ọchịchị Willie Obiano.”
Onye isi otu a bụ Frank Uduonu na okwu ole na ole okwuru kelere ọtụtụ ndị na enyere ya aka n’ịkwado ya n’ọlụ a.
Onye isi ụlọ ọlụ ANPC bụ ‘Sir’ Chuka Nnabuife n’okwu ya na mmemme ahụ kwuru na mbọ a na- agba bụ ka ha kwado ndị ntorobia n’obodo anyị ka ha dị mma ma pụta ife nke ọma. O kwuru sị na ọlụ ‘Anti-Piracy’ adịghị mfe ma ụfọdụ ndị mmadụ na ahụta ya dịka ọlụ dị mfe.
“Ọtụtụ ndị na echepụta ihe ha ga eme ma n’ikpeazụ ha agaghị enwe ike ime ya ka ọ pụta ihe nke anya ga afụ. Ụfọdụ ndị egwu tie egwu, ha ga na-agba mbọ ka egwu ha ga-esi pụta ihe, ndị ọzọ etigharia ya bụ egwu”. O kwukwara na ọlụ ndị Anti-Piracy bụ inye aka mee ka onye tara ahụhụ rie uru ọlụ ya.
Onye isi otu a na ‘South East’ kwuru na ha chọrọ ka ndị na emepụta ihe na ndị ji ihe emepụtara eme ihe dị mma. Otu anyị nwere ọnọdụ na Enugu, Abakaliki, Imo na obodo ndị ọzọ dị iche iche.
Akpọlitere mmadụ dịka Akam Humphrey onye nke gosipụtara ihe adịgboroja ndị mmadụ na emepụta n’obodo. Ọ kọwara otu ha si ama adigboroja ma ha hụ ya. O siri na ndị adịgboroja hụ ngwa ahịa mebiri emebi, ha bute ya, ha aga bie akwụkwọ nke ngwa ahịa dị mma mado n’ahụ nke adigboroja.