AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ anatala onyinye nkwanye ùgwù ọhụrụ ahụ o nwetara nso nso a dịka gọvanọ kacha eme nke ọma n’atụmatụ nchekwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ ala anyị, ma kọwaa ya dịka nnukwu ihe mwulite mmụọ na ihe agbam ume iji sị ya jisie ike n’ọrụ.
Gọvanọ Obianọ mere ka a mara nke a n’Awka oge ọ natara ya bụ onyinye nkwanye ùgwù site n’aka osote ya bụ Dọkịta Nkem Okeke, bụ onye nọchitere anya ya ụbọchị ụbọchị e mere mmemme inye ya ihe nturu ugo ahụ, bụ nke e mere na Banjul nke mba Gambia.
N’okwu ya dịka ọ na-enyefe onyinye nkwanye ùgwù ahụ n’aka gọvanọ, Dọkịta Okeke kọwara na nke ahụ bụ nnọọ ihe ịgba akaebe na mba ụwa na-ahụta ihe dị iche iche Gọvanọ Obianọ na-eme n’iji nwògharị ngalaba niile nke steeti ahụ.
O kwuru na ya bụ mmemme weere ọnọdụ kpọmkwem na mba Gambia dọtara ọtụtụ ndị sitere ebe dị iche iche na mba ụwa wee bịa ụbọchị ahụ, ma bụrụkwa nke aka na-achị steeti Abịa bụ Dọkịta Okezie Ikpeazụ nyere nkuzi na ya, ebe onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ bụ Maazị Garba Ụmar nọchitere anya onyeisi ndị uwe ojii n’ala anyị, bụkwa onye e nyere onyinye nkwányé ùgwù ụbọchị ahụ.
A nọkwara n’ọgbakọ ahụ wee nyefekwa n’aka Gọvanọ Obianọ, onyinye nkwanye ugwu ọzọ e nyere steeti ahụ dịka steeti kacha eme nke ọma n’ibu agha megide ọkụ ọgbụgba n’ala Nigeria, bụkwa nke e nyefere ya site n’aka onyeisi ọkụ na steeti ahụ, bụ Maazị Martin Agbili.
Maazị Agbili kọwara na nke ahụ bụ agba nke anọ nke onyinye nkwanye ugwu ahụ, bụ nke o kwuru na ọ bụ omenafọ, ma kọwaa na ọ bụ ezi agbam mbọ Gọvanọ Obianọ mere o jiri wee turu ùgò na ya.
N’okwu nke ya dịka ọ na-anabata onyinye nkwanye ùgwù ndị ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwara nke ahụ dịka ihe agbam ume na ihe iwulite mmụọ nyere ya iji rụrụ ọrụ ọma ya gaa n’ihu. O tokwazịrị ngalaba ụlọ ọrụ niile nke steeti ahụ n’ịgba mbọ ha dị iche iche, bụ nke o kwuru na o so n’ihe debegoro steeti ahụ n’ogoogo ahụ dị elu ọ nọ ugbu a, ma kwekwazie nkwa ịga n’ihu n’ọrụ mmepe ahụ o ji n’aka ugbu a na steeti ahụ.