Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ na nso nso a n’ụlọ ụka St Martin’s Catholic Church, Igboukwu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata. Ụbọchị ahụ bụ oke ụbọchi na ndụ Very Rev Fada Emmanuel Chukwunalu Anulunko dịka ọ tụụrụ Chineke mmamma maka ịgba afọ iri asaa n’elu ụwa a tinyekwara afọ iri anọ ọ jị buru ụkọchukwu.
Nke a bụ nnọọ mmemme ikele Chineke n”eziokwu n’ihi na ụmụ mmadu si n’ugwu na ndịda wee bịa soro Fada Anulunko wee ñurịa.
E ji aja maasi elekere iri wee malite ya ebe Fada Anulunko no wee kelee Chineke n’ebe ọ dị ukwuu. O kwuru si na ọ bụ site n’amara Chineke ka ya jị wee dị ndụ ma na-alụkwa ọlụ ya.
O kwuru si: “Abụ m Fada Emmanuel Anulunko, nwa Jonas na Susanna Anulunko n’Achalla Umuchu. Ana m ekele Chineke, aja maasi a ka m ji kele ya. Agaghị m ekelekata ya kwusi, ana m ekenekwaa ununwa biara abịa.”
Fada Anulunko gakwara n’ihu kenee ndị St Martin’s Igboukwu na ndị Igboukwu nile n’ihi na ọ bụ n’Igboukwu ka o malitere ọlụ mgbe ọ chichara Fada n’afọ 1978, mgbe obodo dị iche iche dị na ‘Our Lady of Fatima Parish’ Igboukwu.
O kelere ọtụtụ ndị mmadụ nyeere ya aka oge nile ịkọ n’ugbo Chineke iri afọ anọ zuru ezu; ma kelekwaa ndị Umuchu Alanso na ndị ezinaụlọ ya, ndị be Alununo maka mmeso ọma ha.
N’okwu Chukwu, Fada Anthony Ezeoke kọwara mmemme ahụ dịka amara na ihunanya Chineke. O kwuru na echichi ụkọchukwu bụ ihe omimi.
O toro Fada Emmanuel Anulunko maka ịgba mbọ ya. O kwuru si; “Fada Anulunko bụ onye udo. Onwe ya juru ya afọ. Nke a si n’ụdị ezinaụlọ o siri pụta, ezinaụlọ juputara n’udo na ihunanya dịka ezinaụlọ dị asọ nke Nazareth.”
Fada Ezeoke gara n’ihu kwuo na ọ bụ otu ezinaụlọ ahụ zupụtara Fada Emma dịka fada izizi n’Umuchu zuputakwara sista izizi n’Umuchu bụ Rev Sr Appolonia Anulunko (nwanne fada).
Dịka fada na-echeta afọ iri anọ o ji chie fada n’afọ a, sista nwanne ya na-echeta afọ iri ise o ji chie sista.
Nke a pụtara na ọ bụ otu di na nwunye (Jonas na Sussana Anulunko) mụtara sista na fada izizi e nwere n’Umuchu.
Dịka ọ gara n’ihu ikele Chineke n’isi fada, ọ kpọkuru ndị ụka ka ha na-enye ya nkwado ma na ekpekwara ya ekpere.
N’ikpeazu Fada Ezeoke rụtụụrụ ndị mmadụ aka mkpa ọ dị ito Chineke na inyere ndị ụkọchukwu aka n’ọlụ ha.
‘His Royal Majesty’ Igwe Emmanuel Chukwukadibia Onyeneke (Igwe Ezejiofo EKwulobia) kwuru na ọ bụ ihe inye Chineke ekene) ma bụrụ ihe nnukwu ọñụ n’ebe Fr Anulunko nọ. Onye isi ndị nne ‘Director’ CWO Awka dayọsis bụ Lady Theresa Azodo na ndị otu ya bịara ma gọọrọ Fada Anulunko ọfọ ma tọkwaa Chineke n’isi ya.
Oliver Anulunko-Omenife Umuchu nyere ekene n’aha nna ya bụ Hyacinth Anulunko (Akaraugo Umuchu). Onye nke o kwuru na ọ nọ n’añụrị ma na-ekpekwa ekpere na ihe nile na-aga nke ọma. Barr Ekene Anulunko kwuru na emume ahụ bụ nnukwu ihe añụrị na ihe inye Chineke otito.
Chief Sylvester (Ezeokenwa Uzeudo Umuchu) kọwara na ọ bụ nnukwu ihe añụrị na fada izizi e nwere n’Umuchu na-eme nnukwu mmemme a ma kwukwaa na ọ bụ amara Chineke.
Ọkammụta ‘Sir’ Fidelis Uzochukwu Okafor, onye jibu ọkwa dịka onye isi mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, kelekwara Chineke n’isi Fr Anulunko.
Rev Sr. Appolonia Anulunko, bụ sista izizi e nwere n’Umuchu ma bụrụkwa nwanne Fada Anulunko kwuru si; “ihe anyị na-ahụ taa si n’aka Chineke, ọ na-eme anyị mma.” Sista gọkwara ọfọ ihe ọma n’isi ndị nile bịara mmemme ahụ.
Ikechukwu Nwezeokana kwuru na ọdịghị mfe ịkọ n’ugbo Chineke afọ iri anọ. O kpere si ka Chineke bidoro ọlụ a n’isi Fada Anulunko luluo ya n’isi.
Ọtụtụ ndị mmadụ gbaara Fada Anulunko ama ndị gunyere A.O Umeh, Barth Nwibe, Fada Zeph Uzor, Fada Boniface Ezeoke, Patrick Orajaka, Ichie Ukwu Agbalanze Umuchu, Alloy Uzor na ọtụtụ ndị ọzọ.
Ha kọwara ya dịka onye umeala, ọmiko na ihunanya ma rịọ Chineke ka ọ na-enyewanye ya ahụ isi ike.