OTU ụmụ Nigeria na-etolite etolite bụ ndị na-ede akwụkwọ a kpọrọ ‘ The Society of Young Nigerian Writers’, ngalaba steetị Anambra e meela emume ome n’afọ nke ha ji echeta Ọkammụta Chinua Achebe bụ a kwaa akwụrụ n’ihe gbasara edemede.
Nke a weere ọnọdụ ụbọchị Fraidee gara aga bụ ụbọchị e ji echeta ọmụmụ Achebe. Emume ahụ kpọtụrụ akpọtụ n’ ụlọ ọba akwụkwọ steeti Anambra ‘Prof Kenneth Dike Central E-Library, Awka’. Isiokwu nke afọ a bụ 2018 bụ ‘Remembering Chinua Achebe: A celebration of Literary Star’.
Onyeisi ndị otu ahụ na steetị Anambra bụ Izunna Okafor ji obi añụrị wee nabata mmadụ nile. O toro Ọkammụta Chinua Achebe maka ike ọ kpara n’edemede.
Ọ kọwara ọtụtụ ihe o mere tinyere ụzọ dị iche iche o si gbaa mbọ na ndụ ya. O kwuru na o kwesiri ka a na-echeta ya mgbe nile. N’ikpeazụ, ọ rụtụrụ aka na mkpa ọ dị ime aha ya ka ọ dị ọkpụtorokpụ.
Ọtụtụ ndị maara ihe ekwe na-akụ maka mmụta, tinyere ụmụakwụkwọ si ebe dị iche iche biara wee soro ndị otu ahụ cheta ọka ibe n’edemede bụ Achebe.
Ọkammụta Ifeyinwa Ogbazi, onye nkuzi a maara aha ya na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n’Awka (UNIZIK), ngalaba asụsụ bekee ‘English, Literary and Gender Studies’ bịara ma nye ha nkuzi bụ ịgba.
Ọkammụta Ogbazi nyere nkuzi ya n’isiokwu na-akọwa Chinua Achebe dịka ọka ibe n’edemede na ụkụta azụ ya. Ọ kọwara mbọ Achebe gbara site n’ịgba Africa na omenala ya n’anwụ nke wetara otito n’ebe ala Africa nọ. Ọ gara n’ihu kwuo na Achebe gosiri ụwa mma Africa nke mere na o kwesiri ka a na-echeta ya.
Ogbazi dụrụ ụmụ akwụkwọ ọdụ ka ha na-agụ akwụkwọ maka na ọ ga-enyere ha aka. Ọ gakwara n’ihu gwa ha ka ha na-ede ihe, ka ha hapụ inwe nkoropu obi kama ka ha na-ede ma na-ebido nwayọọ nwayọọ site n’itinye ọlụ ha n’akwụkwọ akụkọ ‘newspaper’. N’ikpeazụ, ha nyere Ogbazi onyinye nkwanye ugwu ‘award’ maka ịgba mbọ ya tinyere ọlụ ọma ya nile.
Onye isi ụlọ ọlụ akwụkwọ akụkọ ‘National Light’, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra bụ ‘Sir’ Chuka Nnabuife, onye nọrọ dịka onyeisioche ụbọchị ahụ, ma bụrụkwa ode akwụkwọ n’onwe ya, kelere ha nke ukwuu. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha hapụ ihụ edemede akwụkwọ dịka ihe iche aka mgba.Ọ gwara ha si; ‘Jidenụ ka unu ji. Aga m achọ ka unu ka Achebe n’ihi na Igbo na-ekwu sị ka nwa ka nna ya.”
Ọkammụta Kate Azuka Omenugha bụ kọmishọna na-ahụ maka mmụta na steetị Anambra zitere ndị nọchịtere ya bụ ndị si na ngalaba ahụ, Maazị Nnaemeka Egwuonwu na Oriakụ Vera Ogbalu.
A gụputara ozi ya nke kọwara ọlụ Achebe dịka nke wulitere mmụọ ndị mmadụ. O kwuru sị; “Eji m obi añụrị ekele ndị nhazi mmemme a. Ana m akpọ oku ka e nye ha ezigbo nkwado na ịgbaume.”
Fr. Amakeze bụkwa onye ode akwụkwọ nyere ndụmọdụ ka ha na-ego ma na-agụkwa akwụkwọ. Ka ha na-aga n’ọba akwụkwọ ma sonyekwara otu ndị na-agụ ma na-ede akwụkwọ ‘book club’.
Ọ gwakwara ha si; “Debe nu edemede ma na-eziga ya n’akwụkwọ akụkọ ‘Fides’. Ị ga-abụ ode akwụkwọ site n’ide akwụkwọ.”
Ụmụ akwụkwọ si ụlọ akwụkwọ dị iche iche gosipụtara ihe ngosi dịka abụ, ịkpa ọchị ‘jokes’, ịgụpụta A,B,CH, D, wdg. Ụfọdụ haziri ma kọwaa akwụkwọ Achebe dị iche iche. N’ikpeazụ e nyere ụmụakwụkwọ ndị tuuru ugo n’edemede ‘essay’ nke a haziri na mbụ asambodo.
Faith Model School, Awka, St John of God, Awka,Unizik High School, Awka, Kenneth Dike Memorial High School, Awkana St Lucy High School, Awka gbara ndị nke mbụ,abụọ,atọ,anọ na ise n’out n’out.
Ndị ọzọ bịara wee soro nye nkwado ha gụnyere; Ngozi Chuma Ude, Dr Mitchelle Onugbelu, Barr Sally Mbanefo, Arinze Omenwa (Naira Rice), tinyere ndị ọzọ mmụta na-adị mma.