ỤBỌCHỊ bụ nnọọ sọ ọñụ dịka òtù a kpọrọ ‘Ogboada Welfare Association’ jiri obi ụtọ wee merùbe mmemme iri ji ọhụrụ ha nke afọ 2018, wee mechikwa afọ n’ótù.
Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị òtù ahụ, ndị enyi ha, ndị ezinaụlọ ha na ndị na-echere ha ezi echiche.
Na nkuzi pụrụ iche o nyere na ya bụ ọgbakọ, Ọkammụta Gọdwin Onyekaọnwụ kọwara ji dịka nnukwu ihe nakwa nri pụrụ iche na-ejikọta obodo ọnụ ma wetekwa udo. O mere ka a mara na ji bụ eze ihe a kụrụ n’ubi nakwa nri a na-akwanyere ugwu pụrụ iche n’ala Igbo, ma sị na mmemme iri ji ọhụụ bụ oge iji nye Chukwu Abịama òtùtó maka ònyìnye ndụ, ọganihu na ahụ isi ike.
N’okwu nke ya dịka ọ na-awa ji ọhụụ ahụ a hụrụ ahụ, onye nọ dịka nnukwu nna nyere ndị òtù ahụ, bụ Dọkịta Ernest Ifebi, tòrò Chineke maka ndụ na ahụike nke o jiri chọọ ndị òtu ahụ mma ma kpekwa ekpere maka ogologo ndụ na udo.
N’okwu nke ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra etiti n’ụlọ ọgbakọ sineeti ala anyi, bụ Maazị Victor Umeh, nke onye nọchitere anya ya bụ onye nnyocha akpa ego steeti ahụ, bụ Maazị Nchekwube Dunga, gosipụtara obi ụtọ ya banyere oke ọgbakọ oriri na ọñụñụ ahụ, ma chètara ha na APGA bụ otu ndọrọ ndọrọ na-akwalite omenala na ọdịmma ndị Igbo, ma kpọkukwazie ọha mmadụ ka ha kwàdo otu ndọrọ ndọrọ ahụ na nhọpụta izugbe ahụ na-abịa n’ihu.
N’okwu nke ha n’otu n’otu, onyeisi òtù nhazi chịkọbara ọgbakọ ahụ, bụ Oriakụ Adaeze Onyebụchi na otu enyi ndị òtù ahụ bụ MacBenito Ozigbo kelere nhazi mmemme ahụ, ma rịọkwazie Chineke ka o duru ha baa afọ ọhụụ n’ọñụ, ọ bụnadị dịka ọtụtụ n’ime ha ga-agaba ebe dị iche iche imerùbe mmemme ekeresimeesi ha.