ỌCHỊCHỊ steeti Anambra akpọnwèéla gọọmenti etiti ka ọ kwụọ ya ego karịrị ijèri naịra iri anọ o ji ya n’ụgwọ, bụ ego e jiri dozigharịsị ụfọdụ ụzọ gọọmenti etiti dị na steeti ahụ.
Aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ kpọrọ oku a ọzọ oge ọ gara ileta ka ọlụ si aga n’okporo ụzọ Ezira–Ụm’ụọmakụ– Enugwu–Ụmụọnyịa–Achịna, bụ nke dị kilomita iri na abụọ.
O mere ka a mara na ụlọ ọlụ ji ya bụ ọlụ ngó ekwuola na ọ ga-arụchapụ ya bụ ụzọ tupuu isi ngwụcha ọnwa Jenụwarị afọ na-abịa abịa, ma kwuo na ego ahụ gọọmenti etiti ji ya n’ụgwọ ga-enye aka n’ụzọ pụtara ìhè n’ịrụchapụ ya bụ ọlụ, bụzị nke mere o ji akpọku ya ka ọ kwụọ steeti ahụ ya bụ ụgwọ.
O gosipụtara afọ ojuju ya banyere ogoogo e ji alụ ya bụ okporo ụzọ, bụ nke o kwuru na ọ ga-enye aka kwàlite ọnọdụ mmepe, ezi ọnọdụ obibi ndụ na ọnọdụ akụnụba obodo abụọ ahụ, ma kpọkùkwazie ụmụafọ obodo ahụ ka ha gaa n’ihu ịkwàdò ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ na ọlụ ọma dị iche iche o ji n’aka.
Na ntụnye nke ha n’otu n’otu, onyeisi ụlọ ọlụ na-ahụ maka idozisị okporo ụzọ na steeti ahụ, bụ ụlọ ‘Anambra Road Maintenance Agency’, Maazị Emeka Okoye na onye ji ya bụ ọlụ ngó, bụ Maazị Sammy Mustapha kwuru na a wụọla ihe karịrị otu kilomita na ụma ise nke okporo ụzọ ahụ,
waa ọwà mmiri rugoro kilomita abụọ na ụma ise n’akụkụ ya, tinyere ihe ndị ọzọ pụtara ihè a rụpụtagoro na ya bụ ụzọ. Ha mekwara ka a mara na dịka otu ihe si aga, na a na-elegara anya na a gà-arụchapụ ya bụ okporo ụzọ n’oge ahụ e kwuru.
N’okwu dịkwa ka ibe ya, otu nwa amadi selitere isi na mpaghara ebe ahụ, ma bụrụkwa onye jibu ọkwa dịka osote aka na-achị steeti Anambra n’oge gara aga, bụ Maazị Emeka Sibeudu bunyere Gọvanọ Willie Obianọ ụkpa ekele maka mbọ pụtara ihè ọ na-agba n’ibuli steeti ahụ n’ezi ọnọdụ mmepe dị elu na-agbanyeghị ọnọdụ ihe isi ike akụnụba ala anyị nọ n’ime ya ugbu a; ma kpọkùkwazie ya ka o jide ka o ji, ọ bụnadị dịka o kwere nkwà ịkwàdò ya ka ọ gaa n’ihu na ya bụ ọlụ ọma o ji n’aka.