N’OGE Ekeresimesi ọ dị ikuku ọma na- adị eku. A na-agụ egwu dị iche iche iji gosipụta oge ekeresimesi. Obi añụri na-ejupụta ebe nile, ọkachasi na mpaghara ọwụwa anyanwụ ala anyị.
N’ihe dịka ọgụ afọ abụọ gara aga, ezinaụlọ ọ bụla na-ejikere maka Ekeresimesi. Ụmụagbọbịa na-akpa nkụ edebe maka isi nri Ekeresimesi. Ọtụtụ obodo na-amụ egwu dị iche iche iji kwadobe ya bụ Ekeresimesi.
Ọ dị ọtụtụ ihe mere ka Ekeresimesi dị iche n’oge ugbua. Mgbe gboo, adịghị egoro ụmụaka akwa na akpụkpụ ụkwụ oge ekeresimesi ọbụla, adịghị esi osikapa oge ọbụla bụ ekeresimesi.
N’oge ahụ, ndị nọ n’obodo mepere emepe na-agba mbọ alota obodo ha. Ọ na – atọ ụmụaka ụtọ na ha na-ala ụlọ oge ekeresimesi. Ndị nọ n’ime obodo na-añụrị ma ndị nke ha lotara obodo maka ekeresimesi. Ọ bụ ezie na ego adịghị mana oge ekeresimesi ruo, ọñụ pụrụ iche na-adi.
Ma ugbua, ọ dị ọtụtụ ihe mere na ọñụ adịchaghị ka ọ na -adị na mbụ. Ọ bụ ezie na ndụ dịịrị ọtụtụ mmadụ mana ihe isiike dị na ya karịrị nke mere n’oge ahụ rube, obi mmiri a na-amapụ ụfọdụ mmadụ. Ụfọdụ ezinaụlọ adịghị enwe ike igota ihe ha ga- eji agba ekeresimesi.
Ọzọkwa bụ na obi ọjọọ jupụtara ebe nile ugbua mere na onye lachaa ụlọ ekeresimesi bata, ọ gaghị ete akam, ọ bụrụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụ o bido gabigaba ihe ọjọọ dịgasị iche iche.
Ọ dịkwa ọtụtụ ihe mere ka ịla ụlọ oge ekeresimesi beleta. Nke mbụ bụ na ekwenti adịgo ugbua. Onye alaghi ụlọ ga-akpọ ndị nke ya n’ekwentị. Nke abụọ bụ na ụlọ ọba ego jupụtara ebe nile ugbua. Onye alaghị ụlọ nwere ike kwunyere ndị nke ya ego ekeresimesi n’ụlọ ọba ego.