
OBODO jupùtara nnọọ n’añụrị ụbọchị Tuzdee dịka aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyere ndị eze ọdịnala abụọ asambodo maka ịbụ igwe obodo ha dị iche iche. Ndị a bụ eze ọdịnala Utuh dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South na eze ọdịnala obodo Lilu dị n’okpuru ọchịchị Ihiala.
Ya bụ mmemme inye àsàmbodo bụ nke weere ọnọdụ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị e ji okwu ha agba ìzù, nke gụnyere ndị ọlụ gọọmenti, ndị eze ọdịnala, ndị omebe iwu, ndị enyi, ikwu na ibè na ndị òbòdò abụọ ahụ.
N’okwu ya dịka ọ na-enye ha asambodo ahụ, Gọvanọ Willie Obianọ kọwara ndị eze ọdịnala dịka ndị bara oke úrù na ndị nwere nnukwu ọlụ na ntụnye pụrụ iche n’ịkwàlite udo n’obodo. O kwuru na ọ bụ mmasị ọchịchị ya ịkwàlite ezi mmepe tọrọ àtọ n’ime-ime obodo dị iche iche, kpọpụtasịa ọtụtụ ụzọ dị iche iche o sigòrò mee nke ahụ, nke gụnyere inye obodo ọbụla nde naịra iri abụọ ugboro abụọ,
ka ha wee họrọ ma rụọ ihe bụ mkpà ha, ma kpọkùkwazie ndị eze ọdịnala ahụ ka sonyesie ike n’ịkwàdo na imezùputa amụmà mmepe ahụ, ọ bụnadị dịka ọ kpọkwara òkù ka e nwee ezi mmekọrịta n’etiti ha na ndị ji ọkwa ọchịchị obodo ha.
N’okwu nkè ya, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọchịchị ime-ime obodo na ihe gbasaara echichi ọdịnala, bụ Maazị Greg Obi tòrò ọchịchị steeti Anambra maka inye eze ọdịnala abụọ ahụ asambodo, bụ nke ọ kọwara na o mego ka echichi ha na ọnọdụ ha dịka ndị eze ọdịnala zuo òkè,
ma kọwakwa nke ahụ dịka nke ga-enye aka n’ụzọ pụtara ìhè n’ịkwàlite udo na ọnọdụ mmepe bụ ịgbà n’obodo abụọ ahụ.
N’okwu ha n’otu n’otu, eze ọdịnala abụọ ahụ, bụ Igwe Peter Ilomụanya nke Ụtụh na Igwe Godson Onyedịrị nke Lilu, bụ ndị ọñụ jupùtara n’obì kelere gọọmenti steeti Anambra maka inye ha ya bụ asambodo, bụ nke gosiri na ha abụrụgo ndị eze ọdịnala obodo ha dị iche iche.
Ha kwekwazịrị nkwa na site n’enyemaka Chineke, na ha ga-eji oche eze ha wee kwàlite udo na ọnọdụ mmepe n’obodo ha dị iche iche na steeti ahụ n’izugbe.
Ndị dị iche iche sonyere na ya bụ oke mmemme gụnyere okwupụta okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, bụ Oriakụ Rita Madụagwụ, onyeisi otu jikọtara ndị eze ọdịnala na steeti Anambra ma bụrụkwa eze ọdịnala obodo Ọraifite, bụ Igwe Dan Udeọjị, eze ọdịnala Awka, bụ Obi Gibson Nwosu, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.