EMUME Kristi bụ eze bụ nnukwu emume nke zuru ụka Katolic ọnụ n’ụwa nile.Ọ bụ ụbọchị ụka gara aga ka ọ kpọtụrụ ma zụọ azụọ.
Ha na-eme emume a iji kwanyere Kristi ugwu dịka eze na-achị ụwa nile ma gbaara ya ọfala dịka o kwesiri.
A bịa n’Awka, isi obodo steetị Anambra, ụlọ ụkka dị iche iche kara ụka n’ụlọụka ha ma mechaa gbara egwu wee zukọta n’obi Chukwu, ‘St Patrick Cathedral, Awka.
N’aja maasị ekelere iri nke a kara na ‘St Patrick’s’, Rev Fr Mathew Attansey, bụ onye isi ebe ahụ ‘Cathedral administrator’ kọwara ụbọchị ahụ dịka oke ụbọchị. O kwuru si; “Taa bụ ụbọchị añụrị n’ihi na eze anyị na-agba ọfala. Ọ dị mkpa ịmata na eze anyị bụ eze eziokwu, eze udo,
onye jiri onwe ya chụọ aja ka o wee zọpụta anyị. O kwesịrị ka anyị ñomie ya, n’ihi na ọ bụ maka ịhụnanya ya ka o ji were ọbara ya nụchaa anyị. O kwesịrị ka anyị gbaara ya osiari; ya mere ka anyị bido taa mebe ihe dị mma.”
Umụ nwoke ndị gụrụ akwụkwọ na ‘Christ The King College (C.K.C), Onitsha’ bụ ndị nọ n’Awka tụkwaara Chineke mmamma n’aja maasị ahụ n’ihi na ọ bụ ụbọchị ha ji echeta aha ụlọ akwụkwọ ahụ.
Ọkammụta Charles Egolum bụ onye nkuzi na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n’Awka ma bụrụ otu n’ime ndị gụrụ akwụkwọ na C.K.C Onitsha (old boys) kwuru sị na emume ahụ dị nnukwu mkpa ọ kachasi na ndụ ndị nile gụrụ na ya bụ ụlọakwụkwọ.
O kwuru na ha na-ezipụta Kraist dịka eze ụwa nile, eze udo. Ọkammụta Egolum gara n’ihu kwuo na ha agaala mee emume nke bụ ome n’afọ na ndụ ha dịka ha si eme, na ha bịazịrị ụbọchị ụka ahụ ịtụrụ Chineke eze ndị eze mmamma.
Dịka ụbọchị ahụ siri dị, mgbe parishi dị iche iche dị n’Awka zukọtara na ‘St Patrick Cathedral’ ka ha nọzi ebe ahụ wee gbaa ya bụ ọfala n’ụzọ dị egwu.
Bishop dayọsis Awka bụ Most Rev P.C Ezeokafor nọ n’ebe ahụ wee gozie ndị mmadụ. O kwuru sị na Kristi bụ eze ebe nile, na ọ bụghị so n’otu obodo. O kwuru na ọ bụrụ na eze nke ụwa gafee obodo ọzọ, ọ gaghị abụkwa eze ebe ahụ, mana na ọdịghị otu ahụ n’ebe Kristi nọ n’ihi na ọ na-achị ụwa nile.
Bishop Ezeokafor jikwa ohere ahụ hafee Nigeria n’aka Chineke ma dụọ ndị ụka ọdụ ka ha na-eme ihe ha kwesịrị ime dịka ndị otu Kristi.
‘Rev Fr’. Anthony Ezeoke bụ ụkọchukwu nọ na-anabata parishi dị iche iche ka ha na-abata rụtụkwara aka na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị e ji echetakwa ahụ na ọbara Kristi ‘Corpus Kristi’ nke e mere n’ọnwa Jun.
Dịka o siri kwuo, ọ bụ ụbọchị ahụ ka e ji ezipụta na Kristi na-achị eze n’ime ahụ na ọbara ya.
Otu nwaanyị so n’emume ofala ahụ bụ Oriaku Obiako, n’okwu nke ya, kwuru na emume ahu na-egosi na ekeresimesi eruola. O kwuru na mgbe ha di n’umuaka, na ọ bụ ụbọchị e ji esi osikapa, ha richaa ha echerezie ekeresimesi.
Ọ gara n’ihu kwuo na otu onye ọgọ mmụọ ekworola n’ihi emume ahụ bido gawa ụka, ma gbakwaa ama na o na-ebute ọgwụgwọ nsọ.