Ndị Red Cross enyela ndị ide mmiri chupụrụ n’ụlọ ihe onyinye

0
503

NDỊ ọlụ na-eleba anya maka ọdị mma mmadụ ‘The Nigerian Red Cross Society’ site na njikọ nke ndị otu ahụ, ngalaba ofesi azala oku gọọmentị steeti Anambra site n’ịgbatara ndị ide mmiri chụpụrụ n’ụlọ ọsọ enyemaka.

Ha butere ihe onyinye gburu ego karịrị nde naira ise. E kere ihe onyinye ndị ahụ n’obodo dị iche iche mmiri chụpụrụ n’ụlọ.

Mgbe a na-enyefe ihe onyinye ndị a n’aka ndị okpuru ọchịchị Anambra ‘West’ na ‘Bishop Crowder Holding Centre, Onitsha’ ka osote onyeisioche otu ‘Nigerian Red Cross’ bụ Ọkammụta Peter Katchy, kwuru na ya bụ ihe onyinye nke ndị ‘European Union’ kwadoro bụ iji nye aka maka mkpa mkpa ide mmiri kpara. Ọ kọwapụtara na otu ha, nke bụ maka ọdị mma mmadụ ga na-aga n’ihu n’igbata ọsọ enyemaka na steeti Anambra.

N’akụkụ nke ya, ode akwụkwọ otu ahụ bụ Kingsley Okoye dụrụ ha ọdụ ka ha were ihe onyinye ndị ahụ mee ihe dịka o kwesiri.

Otu nwanyị dị ime aha ya bụ Blessing Ojadi na Christopher Nwayibe, bụ  kwuru na ha tufuru ihe nile ha nwere n’aka ide mmiri gosiri afọ ojuju ha n’ebe ndị otu ahụ nọ site n’ịgbatara ha ọsọ enyemaka.

 

 

 

 

 

GUO:  Ide mmiri akpaala nnukwu ike ọzọ na Delta

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here