ÒTÙ jikọtara ndị nta akụkọ n’ala Nigeria bụ ‘Nigeria Union of Journalists (NUJ)’, ngàlàba nke steeti Anambra, amalitela otu nnukwu mmemme omenafọ ha, bụ nke a kpọrọ izuụka ndị nta akụkọ.
Mmemme ahụ bụ nke a malitere n’isi mbido izu ụka a site n’ofufe nro pụrụ iche e nwere n’ụlọ ụka ‘Cathederal Church of St. Faith, Awka’, ma bụrụkwa nke na-ewere ọnọdụ n’isi ụlọ ọlụ ndị otu ahụ na steeti ahụ, bụ ‘Godwin Ezemo International Press Centre’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra.
N’okwu ya dịka ọ na-agbape mmemme ahụ, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nkè onye nọchitere anya ya bụ kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkụziri ọhanaeze ihe ha kwèsìrì ịma, bụ C-Don Adịnụba kọwara ndị nta akụkọ dịka ndị bara oke uru na ndị nwere ọtụtụ ọlụ chere ha n’ihu n’ime ka ọnọdụ ala anyị kawanye mma.
Ọ kpọkuru ndị nta akụkọ ka ha na-agbaso iwu na-achị ọlụ mgbasa ozi, kpachapụ anya n’otu ha si ebu akụkọ, ma zèéré ịgbasa ozi ụgha na ozi pụrụ iduhie ọha mmadụ, n’ihi ihe egwu dị iche iche nke ahụ pụrụ iwètà.
Ọ kọwapụtara ezi mmekọrịta dị n’etiti gọọmenti steeti ahụ na ndị nta akụkọ, kpọpụtasịa ọtụtụ ihe dị iche iche ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ mepụtagoro n’ụlọ mgbasa ozi Anambra Broadcasting Service na ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light, ma kwekwazie nkwa ịga n’ihu n’inye ndị ọlụ nta akụkọ nkwàdo na ezi ọnọdụ dị làrịị iji lụọ ọiụ ha otu o siri kwesi ekwesi; ọ bụnadị dịka ọ kpọkuru ha ka ha zèéré ịgbasa ozi akpọmasị.
Na mbụ n’ozi ha n’otu n’otu, onyeisi oche ndị otu ahụ na steeti ahụ, bụ Maazị Emmanuel Ifesinachi nakwa onyeisi oche ndị otu ahụ n’ala Nigeria, bụ Maazị Chris Isiguzo, nke onye nọchitere anya ya bụ osote onyeisi oche òtù ahụ na ngalaba ndịda ọwụwa anyanwụ ala Nigeria,
bụ Maazị Petrus Obi, mere ka a mara na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji lebaa anya n’otu ndị nta akụkọ si alụ ọlụ ha, ihe ndị gbara ọlụ ha okirikiri na ihe ndị e kwesiri itinyekwu ma ọ bụ iwepù iji mee ka ya bụ ọlụ kawanye mma ma nwekwa mpụta ihe n’ihe ndị na-emegasị n’ala anyị ugbu a. Ha tòrò Gọvanọ Obianọ maka ịbụ enyì ndị nta akụkọ na steeti ahụ na ime ka ha nwekwa òhere ọma na ezi ọnọdụ dị làrịị iji lụọ ọlụ ha otu o kwèsiri, ma kpọkukwazie ndị nta akụkọ ka ha hie asaa n’anya n’ịgbasa ozi ha, maka na ozi ọbụla mmadụ fesara dịka onye nta akụkọ nwere mpụtàrà.
Mmemme ahụ bụ nke a nọrọ na ya wee nye nkụzi n’isi okwu na-asị: “Igwù Okwe Ndọrọndọrọ Ọchịchị, Okwu Akpọmasị Na Ndị Nta Akụkọ”, site n’aka Dọkịta Allen Adum; ma bụrụkwa isi okwu nke onyeisi oche na mmemme ahụ, bụ Maazị Chinedu Obidigwe gbakwasara ụkwụ wee kọwaa ndị nta akụkọ dịka ndị nwere ọlụ pụrụ iche n’ịkwàlite ezi ọchịchị na ime ntụli aka ghe anya oghe n’ala anyị, ọ kachasị ugbu a nhọpụta ọchịchị na-akpụdòbe nso.
Ndị dị iche iche sonyere na ya bụ mmemme gụnyere: onye ji ọkwa ‘Resident Electoral Commissioner’ na steeti ahụ, bụ Dọkịta Nkwachukwu Ọrji, nke Maazị Leo Nkedife nọchitere anya ya; onyeisi ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ National Light, ‘Sir’ Chuka Nnabụife; osote onyeisi oche otu jikọtara ụmụ nwanyị ndị nta akụkọ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, bụ Oriakụ Edochie Chibọta; nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ n’ihe gbaasa ịkwàlite mgbasa ozi ime-ime obodo, Maazị Egbuna Amụta, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.