OTU ụlọikpe nke dị na kasuwan Nama na Jos, isi obodo Steeti Plateau, atụla otu nwata nwoke gbara afọ iri na anọ nga afọ atọ maka ịma nwata nwanyi gbara afọ anọ elu n’ike. Onye ọkaikpe bụ Lawal Suleiman, tụrụ ya bụ nwata nwoke nga n’enyeghị ya ohere ije ego wee gbanahụ ịga nga.
Suleiman kwuru na ya bụ ntaramahụhụ ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị n’ebe ndị ọzọ ga-achọ irụ ụdị arụrụala ahụ nọ. Ozi e nwetara site n’aka ‘Inspector’ Yakubu Audu gwara ụlọikpe ahụ na nna nwata nwanyị ahụ bu Ezekiel Jatau, nke si n’okpuru ọchịchị Riyom, nke dị na Bauchi kwuru na nwoke ahụ jị ụzọ aghụghọ kpọrọ nwa ya nwanyi baa n’ime ọhịa ebe ọ nọrọ maa ya elu n’ike.