NDỊ obodo Akwaihedị dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra eweputala ma gosi ọhanaeze ọmarịcha ụmụ agbọghọ atọ tuuru ugo n’asọmpi mma a chịkọbara n’ọdị nso a maka ụmụ agbọghọ obodo ahụ, bụkwa ndị ọhụrụ a họpụtara dịka ụmụada obodo ahụ maka afọ 2019, site n’asọmpi nwaada kacha mma n’obodo ahụ.
Nke a bụ nke e mere ka a mara site na mpụtara e wepụtara nso nso a n’asọmpi mmä ahụ a chịkọbara, bụ ótù n’ime asọmpi kacha ewu ewù na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ nke ala Nigeria.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ oge ọ kpọpụtachara mpụtara ahụ, onyeisi otu chịkọbara ya bụ asọmpi, bụ Maazị Chidi Okoli, kọwara na nke ahụ màlitere n’afọ 2016 ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ ijikọta ndị ntorobịa obodo ahụ ọnụ, iji wee kwàlite udo na ọnọdụ mmepe nke obodo ahụ, ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo, tinyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
O kelere obodo Akwaihedị, ndị sonyere na ndị tụnyere ụtụ n’ụzọ dị iche iche na ya bụ asọmpi, ndị ikpe, nke Dọkịta Oriakụ Hope Wobikeze nọ n’isi ya, nakwa ndị òtù nhazi nke ya bụ asọmpi, nke Oriaka Joy Ọdụnwa Onyejekwe nọ n’isi ya, ma kpee ka Chineke kwụghachi ha niile mmaji kwuru mmaji.
Maazị Okoli kwukwazịrị na ọkwa ndị dị ahụ tuuru ùgò ga-amalite ịdị ìrè n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afọ na-abịa abịa, ma sịkwa na ọha obodo ahụ ga-anabata ha n’oge mmemme omenafọ ha bụ Aladịmma Akwaihedi nke 2019, nke ga-ewere ọnọdụ n’ọnwa Ọgọọstụ, n’obi eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe J.O.C. Onebunne, dịka ha si eme ya kwà afọ ọbụla.
N’okwu ya dịka ọ na-anabata mpụtàrà ahụ na ọkwa ọhụrụ ya dịka Nwaada Akwaihedi, onye kachara wee nweta ntụli aka n’asọmpi ahụ ma bụrụkwa nwata akwụkwọ Mahadu Steeti Benue, bụ Nwaada Priscilla Umeakuekwe gosipụtara obi añụrị ya banyere ya bụ asọmpi, bụ nke o kwuru na ọ kụziiri ya n’ezie na mmadụ inwe ogologo ntachi obì na-ewèta ọganihu.
N’okwu nke ha n’otu n’otu, onye gbara onye nke abụọ n’asọmpi ahụ, ma bụrụkwa onye tuuru ugo dịka Ihu Omenala Akwaihedi 2019, bụ Nwaada Precious Umeh, na onye nke gbara onye nke atọ ma bụrụkwa onye tuuru ugo dịka Ihu Njèm Nlegharị Anya Akwaihedi 2019, bụ Nwaada Chiọma Obidozie kọwara ya bụ asọmpi dịka nke magburu onwe ya, n’ihi ọtụtụ ihe ọma dị iche iche nke ahụ pụrụ iwèta, ma ugbu a ma n’ọdịnihu.